Otu jikọtara aka na-achị steeti niile n'ala Naijiria adụọla Ụlọ Omeiwu ọdụ ka ha kwụsịtụ ịga n'ihu na ngụpụta nke abụọ maka iwu okwu ịkpọ asị nke dị ha n'ihu ugbua iji hụ na ha lebara anya n'uche ụmụ Naijiria. Osote Onyeisi Otú Ndị Gọvanọ ahụ na Gọvanọ Sokoto Steeti, Aminu Tambuwal, nyere ndụmọdụ a oge ọ na-aza ajụjụ sitere n'aka ndị nta akụkọ oge ndị gọvanọ ahụ mechara nzukọ ha n'isi ala obodo anyị, Abuja, n'abalị ụbọchị Wednezdee.

Igbo sị na ọ na-abụ onye e nyèrè mara chukwaa, ọzọ pụta, e chèta ya. Ọ bụ n'ịgbasò nke a ka gọọmenti steeti Anambra jiri zụta ma bunye ndị ụlọ ahụ na-ahụ maka mkpocha na nzàcha nakwa ọnọdụ adịmọcha n'ime steeti ahụ, bụ ụlọ ọrụ a maara dịka 'Anambra State Waste Management Agency, (ASWAMA)' ụgbọala ọhụrụ na akụrụngwa e ji arụ ọrụ, dị isii n'ọnụ ọgụgụ, iji kwàlitekwuo ma nyere ha aka n'ọrụ ha.

Ụlọ Omeiwu Naijiria ajụla ịmachi ibubata ìgwè na-enye ọkụ dịka ụzọ isi kwalite ọnọdụ ọkụ n'ala anyị. Aro a sitere n'aka Sinatọ Francis Fadahunsi ka amachie ịtụbata ìgwè na-enye ọkụ latiriki maka afọ ise iji were wulite ọnụdụ ọkụ latiriki n'ala anyị ma gbapụ ya ọsọ ịhụ na-ewetara ụsa nye ọtụtụ nsogbu na ihe iche aka mgba dịrị ya.

Ọchịchị steeti Anambra ekesàala akwụkwọ ndọrọ ego karịrị otu narị nde naịra nyegara ndị ahụ ajọ ọkụ ọgbụgba ahụ gbara n'ahịa Ọchanja Ọnịtsha na nso-nso a metụtara, iji tie ha aka n'obi ma kwàdo ha. Mmemme nkesà ego ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ebe obibi Gọvanọ dị n'Amawbịa, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị dị iche iche selitere isi n'ọchịchị steeti ahụ, nke gụnyere onyeisi oche otu ndọrọ-ndọrọ APGA, bụ Maazị Victor Oye; odeakwụkwọ izugbe steeti ahụ, bụ Maazị Solo Chukwulobelụ; Kọmishọna na-ahụ maka azụmahịa, bụ Maazị Uchenna Okafor, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

N'ụtụtụ ụbọchị Mọndee, ụlọọrụ na-ahụ maka ntụliaka INEC, kpọpụtara Bello dịka onye turu ugo na ntụliaka gọvanọ emere ụbọchị Satọdee na Steeti Kogi. Anyị ga-amata na-akwụsịrị ịkpọpụta mpụtara ntụliaka ụbọchị ụka dịka mpụtara ntụliaka ahụ sitere okpuru ọchịchị ime obodo iri na iteghete n'ime iri abụọ na otu dị na steeti ahụ.

More Articles ...