Ndịisi Ohaneze Ndigbo Enweela Ọgbakọ, Gwa Ndị Ntorobịa Tinye Mma n'Ọbọ

Jul 17, 2021 - 21:27
 0
Ndịisi Ohaneze Ndigbo Enweela Ọgbakọ, Gwa Ndị Ntorobịa Tinye Mma n'Ọbọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndịisi ọchịchị otu Ọhaneze Ndị Igbo nọrọ na nsonso a wee guzobe òtù ọrụ ikpe pụrụ iche iji tinye anya n'etu usoro ikpe ahụ gọọmenti ala Nigeria na-ekpe onyeisi ndị òtù 'Indigenous People of Biafra (IPoB)', bụ Maazị Nnamdi Kanu ga-esi wee gaa.

Nke a bụ otu n'ime mpụtàrà ọgbakọ ndịisi Ọhaneze Ndị Igbo nwèrè na nsonso a na steeti Enugu, bụkwa ebe ha nọrọ wee tinye ọnụ n'okwu metụtara njide ahụ e jidere Maazị Kanu nà ikpe ya ikpe, tinyere ụfọdụ okwu ndị ọzọ dịka ọchịchị ala Nigeria, nsogbu ndị Fulani na-achị ehi, ọnọdụ nchekwa, amụmà 'Petroleum Industries Bill (PIB)', na ụfọdụ ihe ndị ọzọ ha tinyere ọnụ na ya ma mekwa nkwekọrịta dị iche iche.

N'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ banyere nkwekọrịta dị iche iche ha mere n'ọgbakọ ahụ, ọnụ na-ekwuru ndị òtù ahụ, bụ Maazị Alex Ogbonnia mere ka a mara na ọ bụ eziokwu na ndị òtù ahụ anaghị ekwugide kpọmkwem njide ahụ e jidere Maazị Kanu ọzọ, mana ha na-ekwu ka ikpe a ga-ekpe ya bụrụ nke a ga-eme n'ụzọ iwu kwàdòrò na n'usoro ikpe nkwụmọtọ kwesiri ekwesi, n'ịgbaso ogoogo mba ụwa.

O mere ka a mara na ndị òtù ahụ kwekọrịtara ma kpebie iguzobe òtù ọrụ ikpe ga-etinye anya ịhụ ka ya bụ ikpe a na-ekpe Kanu ga-esi gaa, bụkwazị ndị ha họpụtara ụbọchị ahụ, nke ọ bụkwa onye ndụmọdụ ndị otu Ọhaneze Ndigbo n'ihe metụtara iwu nọ n'isi ya, iji hụ na kpere ya bụ nwa amadi ikpe nkwụmọtọ.

Ndịisi otu Ọhaneze Ndị Igbo ahụ nọkwara na nzukọ ahụ wee tòó ma kwupụta nkwàdo ha nye mkpebi na nkwekọrịta ahụ ndị gọvanọ mpaghara ndịda anyanwụ ala Nigeria mere na nsonso a megide ịchị ehi na-agagharị n'okporoụzọ dị iche iche na steeti dị iche iche dị na mpaghara ahụ.

Ọ sị na ha kwekọrịtakwara ma kwupụta ka iji ọkwa ọchịchị onyeisiala Nigeria bụrụ nke a ga na-ebugharị ebugharị na mpaghara dị iche iche n'ala Nigeria, n'ụdị e nye ndị ebe a, e nye ndị ebe a, maka na ọ na-abụ òkè zuo ọnụ, ọñụ ezuo ọnụ. O kwuru na ha bụ ndị Ọhaneze Ndị Igbo kwenyekwara na mkpebi ahụ ndị gọvanọ mpaghara ndịda anyanwụ ala Nigeria mere na onye ọzọ ga-abụ onyeisiala Nigeria ga-esite na mpaghara ahụ.

O mekwara ka a mara na ha bụ ndị ndu Ọhaneze Ndị Igbo ahụ tinyèkwàrà ọnụ n'okwu banyere amụmà 'Petroleum Industries Bill (PIB)' ma kwàdó pasenti ise maka ndị obodo e si na be ha egwupụta mmanụ agbidi. 

Ha katọrọ etu e si emekpà ndị Igbo ahụ ma katọkwa etu ndị Fulani na-achị ehi si eme mkpamkpa na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Igbo, ma dụọ ndị ntorobịa Igbo ọdụ ka ha tinye mma ha n'ọbọ ma na-agbaso udo, usoro mkparịtaụka na usoro iwu kwàdòrò wee na-egosipụta obi ha, karịa ime ya n'ụzọ iwu akwadoghị na n'ụzọ tigbuo zọgbuo maka na nke ahụ agaghị amịta ezi a tụrụ anya.

Ndị òtù ahụ jikwàzịrị ohere ahụ wee kpọkuo ma dụọ ụmụafọ Igbo ọdụ, ọkachasị ndị ntorobịa, ka ha sonyesie ike n'atụmatụ ndebanye aha ahụ ụlọọrụ 'Independent National Electoral Commission (INEC) na-eme ugbua iji wee nweta akwụkwọ ikike e ji atụ akwụkwọ, n'ihi na ọ bụ site na ya ka ha ga-esi gbanwee maọbụ họpụta onye ha chọrọ n'ọkwa ọchịchị ma wetekwa ezi ọnọdụ ọchịchị kwesiri ekwesi.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484