N'Anambra, Ndị Uweojii Egbochiela Mwakpo Ndị Ojiegbe n'Isi Ụlọọrụ Uweojii Ọzọ

Apr 20, 2022 - 22:08
 0
N'Anambra, Ndị Uweojii Egbochiela Mwakpo Ndị Ojiegbe n'Isi Ụlọọrụ Uweojii Ọzọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụbọchị bụnnọọ njọ ahịa maka ndị ojiegbe n'ime steeti Anambra, dịka ha ndị uweojii gbochiri nwakpo ha n'ogigie isi ụlọọrụ ndị uweojii ọzọ n'ime steeti ahụ, wee mee ka atụmatụ ha bụrụ nke mara afọ n'ala.

Nke a bụ nke mere n'ọnụ ụtụtụ ụbọchị Wenezdee oge ndị omekoome ahụ wakporo isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Anaku, bụ ebe ndị uweojii nọrọ wee gosi ha ihe nwoke jiri karị ibe ya, site n'ịkwaso ha mgbọ, nke mezịrị ka ha rie mbọmbọ ọsọ.

Kaosiladị, tupu ha rie mbọmbọ ọsọ, ha tụnyere ụfọdụ ihe mbigbọ (ogbunigwe) ha jiri bịa n'ime ụfọdụ ụgbọala ndị uweojii dị n'ogige ebe ahụ, ha wee nwuru ọkụ. Ọkụ ahụ gbapịara ụgbọala atọ n'ogige ahụ, bụ ụgbọala ndị uweojii ji aga ọrụ; mana o nweghị ihe metụtara ogige ụlọọrụ ndị uweojii ahụ; o nweghịkwa onye uweojii ọbụla tụfuru ndụ ya.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ DSP Toochukwu Ikenga kwuru na nke ahụ mere eme n'ezie; ma kọwaa na ndị uweojii steeti ahụ ahụ dịzị ezi njikere ugbua karịa ka ha dị na mbụ ichekwa ndụ na akụnụba ụmụ mmadụ, na ichekwaba ụlọọrụ ha na ihe ha ji arụ ọrụ pụọ na mwakpo ndị omekoome.

O kwuru na e zigala ndị uweojii pụrụ iche na mpaghara ebe ahụ maka adị ama ama, ma kwukwa na ha na-agbasi mbọ ike iji nwụchie ndị omekoome ahụ ma chụkwa mpụ na arụrụala ọsọ na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484