Soludo Akpọlitela Mmadụ Asatọ Ọzọ n'Ọkwa Ọhụrụ

Apr 20, 2022 - 21:55
 0
Soludo Akpọlitela Mmadụ Asatọ Ọzọ n'Ọkwa Ọhụrụ


Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo akpọlitela mmadụ asatọ ọzọ n'ọkwa ọhụrụ dị icheiche na gọọmenti ya

Mkpọlite n'ọkwa ọhụrụ a a bụ nke bịara ka ọ gachara ihe dịka mkpụrụ ụbọchị iri atọ na abụọ e jiri duo ya n'iyi ọrụ dịka aka na-achị steeti ahụ, ma bụkwa nke e mere ka ụwa mara site n'ọnụ Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na steeti ahụ, bụ Maazị Paul Nwosu, site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ ụbọchị Tuzdee.

Dịka o siri kọwaa, ndị ahụ a kpọlitere n'ọkwa ọhụrụ nà ọkwa ha gụnyere: Maazị Chukwuemeka Fred Agbata (onye a kpọlitere n'ọkwa dịka onyeisi ụlọọrụ ‘ICT Agency’); Maazị Chike Anyaonu (onye a kpọlitere n'ọkwa dịka onyeisi ụlọọrụ ‘Anambra State Housing Development Corporation’); Maazị Joe Anatune (onye a kpọlitere n'ọkwa dịka onyeisi ụlọọrụ ‘Anambra State Signage and Advertising Agency’); na Maazị Okey Ezeobi (onye a kpọlitere n'ọkwa dịka onyeisi ụlọọrụ ‘Anambra State Bureau of Public Procurement’).

Ndị ọzọ gụnyere: Maazị Christian Aburime (onye ọ kpọlitere n'ọkwa dịka odeakwụkwọ mgbasaozi ya); Ọkaiwu Tochukwu Nweke (onye ọ kpọlitere n'ọkwa dịka onye ndụmọdụ pụrụ iche n'ihe gbasaara amụma iwu); Dọkịta Nelson Omenugha (onye ọ kpọlitere n'ọkwa dịka onye ndụmọdụ pụrụ iche n'ihe gbasaara nkwàlite ndị ntorobịa); na Maazị Bob-Manuel Udokwu (onye ọ kpọlitere n'ọkwa dịka onye ndụmọdụ pụrụ iche n'ihe gbasaara ime obi añụrị, mmesapụahụ na njem nlegharịanya).

N'okwu ya banyere nke mkpọlite ahụ a kpọlitere ya, onye ndụmọdụ pụrụ iche n'ihe gbasaara ime obi añụrị, mmesapụahụ na njem nlegharịanya, bụ Maazị Bob-Manuel Udokwu, onye bụkwa onye na-eme ejije a mà àmá kèlèrè Gọvanọ Soludo maka ịhụta ya dịka onye tozuru oke maka ya bụ mkpọlite.

O kwezịrị nkwà iji ahụmahụ ya wee jeere steeti ahụ ozi ọzọ n'ikwesi ntụkwasịobi, ya na ịrụ ọrụ ahụ a hànyèrè ya n'aka nke ọma karịa ka a tụrụ anya.

Ọ dị ncheta na Maazị Udokwu jikwara ọkwa dịka nnukwu onye ndụmọdụ pụrụ iche nye gọvanọ n'oge ọchịchị nke Gọvanọ Willie Obianọ gwụrụ agwụ na nsonso a.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484