Mba Amerịka chọrọ ịmata ịhe gburu ndị soja Amerịka anọ na Niger

Mba Amerịka chọrọ ịmata ịhe gburu ndị soja Amerịka anọ na Niger

Oct 20, 2017 - 18:55
Jan 19, 2021 - 19:17
 0
Mba Amerịka chọrọ ịmata ịhe gburu ndị soja Amerịka anọ na Niger
: :
playing

Mba Amerịka amalitego ime nnyocha iji mata otu mmiri siri ba n’opi ugbọgụrụ. Pentagon, isi ụlọ ọrụ ndị soja n’obodo Washington agwago ndị nta akụkọ na gọọmenti mba Amerịka na-eme nnyocha ugbu a maka ọnwụ mmadụ anọ ndị soja Amerịka ahụ e gburu na mba Niger, na mpaghara ọdịda anyanwụ mba Afrịka.

N’izu ụka abụọ gara aga, e gburu ndị agha mba Amerịka anọ na Niger.

Ịhe gbara ndị mmadụ gharịị karịsịa bụ na onye isi ala mba Amerịka, Donald Trump, bụ onye ụwa niile maara ọfụma dịka Oji Twitter Ekwu, ekwughị okwu ọbụna gbasara ọnwụ ndị soja ahụ.

Trump atụpụghị ọnụ na Radio. Ọ tụpụghị ọnụ na Televishọnụ. O kwughị cham site n’ama saiba Twitter, ebe ọ na-adịwaga etinye ọnụ n'okwu ọbụna gafere nu, ma nke nwere isi, ma nke na-enweghị isi.

Nke a mere ọtụtụ ndị nta akụkọ jiri gbawa ya ajụjụ, iji chọpụta ịhe ọ maara gbasara ọnwụ ndị soja anọ ahụ.

Otu n’ịme ndị ahụ e gburu n’agha bụ Sagent La David Johnson, onye anyị nụrụ na Trump akpaghị agwa dịka onye ṅụjuru mmiri ara afọ mgbe ọ kpọrọ nwụnye Johnson n’ekwe ntị maka isepuru ya maka ọnwụ di ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.