Ndị Ọrụ Nchekwa Agbaala Otu Onye Ohi Ọkụ n'Anambra

Mar 18, 2022 - 23:26
 0
Ndị Ọrụ Nchekwa Agbaala Otu Onye Ohi Ọkụ n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ bụ ‘ụwà bịa kirie’ n'Ifite Awka dị na steeti Anambra ụbọchị Tuzdee, dịka ndị ọrụ nchekwa jidere otu onye a na-enyo ènyò na ọ bụ onye ohi, ma gbaa ya ọkụ na ndụ ozigbo.

Nke a bụ nke mere kpọnkwem na mpaghara ebe a maara dịka ‘Miracle Junction’ dị n'Ifite, n'okporoụzọ ebe ahụ e si aga Mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Awka. 

Dịka akụkọ siri kọọ, mmadụ isii a na-enyo ènyò na ha bụ ndị ohi bùrù égbè wee wụchaa n'ụlọọrụ ndị ọrụ nchekwa ahụ dị n'Ifite ahụ, bụ ebe ndị orụ nchekwa ahụ kpọchìrì onye òtù ha ha jidere na mgbe gara aga oge ha gara ohi na mpaghara Ifite ahụ, n'ihi na o tèéla ha jiri yibe ndị mmadụ égwù n'ebe ahụ. Ka ha rutere ebe ahụ, ha kpọghepuru egbe ha ozigbo, ha na ndị ọrụ nchekwa wee bido kwaba mgbọ.

Ka ịkwà mgbọ ahụ na-aga n'ihu, ndị omekoome ahụ gbàgbùrù otu onye n'ime ndị ọrụ nchekwa ahụ, ebe ndị ọrụ nchekwa ahụ jidere mmadụ atọ n'ime ha, n'ihi na mgbọ ekweghị aba ha ahụ maka ọdịechi ha gwọrọ.

Onye ọnọmgbeomere kọwàrà na n'ime mmadụ atọ ahụ ndị uweojii ahụ jidere, na ha gburu otu onye n'ime ha, kpụnye ndị uweojii otu onye, ma gbaa otu onye nke ọzọ ọkụ na ndụ, bụ onye nke ahụ gbagburu otu onye ọrụ nchekwa oge a na-akwà mgbọ.

Mbọ niile a gbara iji nweta ọnụmmiri okwu onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n'ime steeti ahụ, bụ DSP Tochukwu Ikenga, amịtàghị mkpụrụ ọbụla, n'ihi na ọ zaghàchighị ajụjụ a jụrụ ya banyere nke ahụ, wee ruo mgbe e bipụtara akụkọ a.

Ọ dị ncheta na a gbaala ọtụtụ ndị mmadụ ọkụ na nsonso a na mpaghara ebe dị icheiche n'ime steeti Anambra, bụkwazị nke mere onyeisi ndị uweojii n'ime steeti ahụ, bụ Maazị Echeng Echeng jiri kpọọ òkù na nsonso a ka a kwụsị ihe dị otu ahụ ma na-agbaso usoro iwu oge niile.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484