Bishọọpụ Okpaleke agaala njem oziọma mbụ na Holy Name Parish, Umuchu

May 16, 2022 - 20:02
 0
Bishọọpụ Okpaleke agaala njem oziọma mbụ na Holy Name Parish, Umuchu

Izunna Okafor na Chinwendu Uzoatu

 Ọ kpọtụrụ akpọtụ n'ụlọụka ‘Holy Name Catholic Church, Umuchu’ nke dị n'okpuru ọchịchị Aguata, na steeti Anambra; ka Bishọp ụka katọlik na dayọsis Ekwulobia, bụ́ Bishọọpụ Peter Eberechukwu Okpaleke wụchara maka njem oziọma (Pastoral Visit) nke mbụ ya n'ụlọụka ahụ. Ndị mmadụ juru ebe niile ma were otu obi sị Bishọp 'nnọọ ije'.

 E ji àjà Maasị dị Asọ malite oke mmemme ahụ, nke Bishọọpụ nọ na ya doo mmadụ dị narị atọ na iri asaa (370) n'ọnụọgụgụ ike n'okwukwe (Sacrament of Confirmation).

N'okwuchukwu ya n'ebe ahụ, Bishọọpụ Okpaleke kpọkuru ndị o doro ike n'okwukwe ka ha gbasie ike dịka ndị nke Chineke.

Ọ sị: "Okwukwe anyị  bụ ụzọ anyị ga-eji ru eligwe. Gbasienụ ike ma zuo òkè dịka ndị agha Jesu Kristi. Ọ ga-adịrị ụnụ mma n'aha Onyenweanyị Jesu Kristi."

Ya bụ Bishọọpụ gara n'ihu kpọkuo ahụ ka ha na-echeta oge niile, dịka ha na-etolite, nà e doro ha ike n'okwukwe. O kelekwara nne na nna ha tinyere ndị niile kwadoro ha, ma kpọkukwaa ndị nne na nna ka ha nye ụmụ ha nkwàdó ka ha banye n'otu ekpere ha nọ n'ụka.

 Dịka ụbọchị ahụ bụ Ụka Nna, Bishọọpụ Okpalaeke tòrò ndị nna ma kpọkuo ha ka ha zuo oke n'ọrụ ha.

 N'okwu nke ya oge ọ na-ekele ya bụ Bishọọpụ maka mbọ ọ na-agba na dayọsis Ekwulobia, onyeisi nchụaja n'ụlọụka ahụ, bụ Fada Johnbosco Ezekoli kpere ka Chineke gaa n'ihu na-edu ya. 

Ọ sị: "Chineke ga-aga n'ihu na-edu gị, na-enye gị ike n'elu ike na amara n'elu amara iji rụọ ọrụ nke ọma, n'aha Onyenweanyị Jesu Kristi. Ọ dị mma na Bishọp sonyeere anyị n'emume ụka nna nke afọ a, na Holy Name Parish."
 
N'akụkụ nke ya, Sista Mary Florentina Onuorah gosipụtara ọṅụ ya n'ebe Bishọọpụ ahụ nọ nà etu ọrụ na mgbasa oziọma si agawanye n'ihu na dayọsis ahụ.

Ọ sị: "Enweghị m ọlaọcha maọbụ ọlaedo, nkwa m na-ekwe bụ ekpere ụbọchị ọbụla."

N'ajụjụọnụ dị icheiche a gbara ha, nwoke na nwaanyị mụrụ (sponsors) ndị ahụ e doro ike n'okwukwe, bụ Sir Vitus Ezechukwu na Ọkammụta Eugenia Ojiako kelere Chineke maka ụbọchị ahụ ma rịọ Mụọ Nsọ ka ọ nọnyere Bishọp Okpaleke n'ọrụ ya dịka Bishọọpụ mbụ nke dayọsis Ekwulobia.

 Onyeisioche òtù ndị nna (Catholic Men Organisation) na dayọsis Ekwulobia, bụ Vitus Uzor kelere Chineke n'isi Bishọọpụ Okpalaeke, ma kwuo na njem ahụ ga-ewulite mmụọ ha ma bụrụkwa nnukwu ihe agbamume nye ha.

 N'akụkụ nke ha, Onyeisioche mmemme ahụ, Dọkịnta Francis Uzor na Onyeisi ọchịchị obodo (President General) ‘Umuchu Improvement Union’, Maazị Emeka Ononuju gosipụtara afọojuju ya nwere banyere njem oziọma ahụ Bishọọpụ bịara, ma kpọkuo Chineke onye malitere ọrụ ọma ahụ n'isi ya bụ Bishọọpụ, ka Ọ rụrụ ya na-aga n'ihu.

 N'obi juputara n'ọṅụ, ụmụaka abụọ so na ndị e doro ike n'okwukwe, nke gụnyere Chibueze Ezeuka na Divine Ezechukwu kelere Chineke maka sakaramenti ha natara; ma kpọkuo Ya ka Ọ gọzie  Bishọọpụ ahụ, Ụkọchukwu Parish ahụ, nne na nna ha, tinyere ndị niile kwadoro ha.

 Ihe pụrụ iche e mere na mmemme ahụ gụnyere abụ, egwu ọdịnala na ọtụtụ ihe ndị ọzọ mere ka emume ahụ daa ụda ma juputakwa n'ebube.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484