Fada E Nyere Ocheazụ Na Benue Enwetela Mmeri Iji Aha APC Zọọ Ọkwa Gọvanọ

Jun 7, 2022 - 21:27
 0
Fada E Nyere Ocheazụ Na Benue Enwetela Mmeri Iji Aha APC Zọọ Ọkwa Gọvanọ

  Chinwendu Uzoatu dere akụkọ a

  Ụkọchukwu ụka katọlik dayọsis Gboko, nke dị na steeti Benue, Fada Hyacinth Alia enwetela mmeri iji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressive Congres (APC) wee zọọ ọkwa gọvanọ na steeti Benue.
 Fada ahụ ka e kwuru na o meriri ndị ya na ha zọrọ ya bụ ọkwa, ndị gụnyere, Banabas Gemade, jibu ọkwa onyeisioche PDP n'ala Nigeria na Mike Aondoakaa, jibu ọkwa ‘Attorney General of the Federation’.
 O nwetara vootu karịrị puku asaa, ebe ụfọdụ ndị ya na ha zọrọ ọkwa enwetaghị ọbụladị otu vootu n'ụfọdụ okpuruọchịchị ime obodo.
 Fada Alia kwuru oge ọ banyere ndọrọndọrọ ọchịchị na ihe kpaliri mmụọ ya bụ ka ya zọpụta steeti Benue, ma kọwaa na site mgbe ahụ o kpebiri ịza oku ndị nke ya, na o doro ya anya aja chere ya n'ihu, ọ ga-achụ.
 Ọ dị ncheta na Bishop dayọsis Gboko, Most Rev. William Avenya nyere Fada Alia ocheazụ maka ịbanye n'ígwù okwe ndọrọndọrọ ọchịchị na isonye n'ịzọ ọkwa gọvanọ na steeti Benue, nke a ga-eme na 2023. Ka ọ dị ugbua, ọ gaghị na-arụziri ndị mmadụ ọrụ ụkọchukwu n'ihi ocheazụ ahụ e nyere ya. Ọnọdụ ahụ e nyere ya bụ ka o siri dị n'iwu ụka katọlik, 'Cannon Law'.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484