Naịjiria Na Ọchịchị Onyekwuoucheya: Nrọ Ịba
![Naịjiria Na Ọchịchị Onyekwuoucheya: Nrọ Ịba](https://igboradio.com/uploads/images/2021/06/image_750x_60c53b9a17c61.jpg)
Izunna Okafor dere abụ a
Isi ụtọ a na-anụ na ntị
Mgbochi ọrịa a kpụ n'ọnụ
Okwu nkà e ji n'aka nri
Mana ha niile bụ n'elu ọnụ
A kpọrọ ya ọchịchị onye kwuo uche ya
Mmadụ ole n'ime anyị kwugoro uche ha
Ebe e jigoro aka ike kpuchie apịa ọnụ
Onye kwuo nke tọrọ ya, a tụwaa ya ọnụ
Kedụ maka ụmụ egbe ha kwògoro ọdụ
Ka onye ọbụla ghara ifego ogo nke karịrị ha
Dịka a ga a ga-asị na ha bụ ihe e debere n'ọrụ
Onye zọọ ọnọdụ ruru ya, e nye ya iche nke karịrị ya.
Ala Naịjiria bụ akpa aja
Ọchịchị onye kwuo uche ya na-atọ aja aja
Onye loo ya bụ akpụ aja n'ike
Ndị ndu ehoo ya ka ero n'ike
Oke ji na àbàla ọ na-azọ ihu ọba
Ọ na-abụ akpa ezughị ezè dibia
Ofeke anyarakwuo atọ
Ndị mbụ na oke udele ọ na-emekọ ihe mmụọ
N'eziokwu,
Mmọnwụ ọbụla ma obom ruuru ya
Ndị ala anyị chọrọ ezi ọchịchị
Ebe onye ọbụla ga-enwe ọnụ okwu
Ntụnye ndị nzè ka e ji emerụ okwu
Egbe bere ugo bere ọha obodo amagbuo onwe ya
© Izunna Okafor
What's Your Reaction?
![like](https://igboradio.com/assets/img/reactions/like.png)
![dislike](https://igboradio.com/assets/img/reactions/dislike.png)
![love](https://igboradio.com/assets/img/reactions/love.png)
![funny](https://igboradio.com/assets/img/reactions/funny.png)
![angry](https://igboradio.com/assets/img/reactions/angry.png)
![sad](https://igboradio.com/assets/img/reactions/sad.png)
![wow](https://igboradio.com/assets/img/reactions/wow.png)