Etu Ndị Igbo Si Egbu, Kee Anụ Okụkọ N’ezinaụlọ

May 30, 2021 - 20:54
 0
Etu Ndị Igbo Si Egbu, Kee Anụ Okụkọ N’ezinaụlọ

Chinwendu Uzoatu na Izunna Okafor


Otu n’ime njirimara ndị Igbo bụ irikọ nri ọnụ. Onye o dịịrị ịhu na e siri nri ma kekwaa ya bụ nne. Ihe kpataara e ji erịkọ nrị ọnụ bu iji gosi na ha niile bụ ụmụnne na onweghi onye na-asọ ibe ya asọ. Ọzọ dị ka ibe ya bụ nne ọbụla maara ole nri onye ọbula nọ n’ezinaụlọ ya ga-ericha.

Mgbe ọbụla e nwere nnukwu mmemme a na-eme n’obodo, dika iri ji ọhụrụ, ịgba ofala w.d.g ezinaụlọ dị iche iche na-egbu ọkụkọ. Mgbe ọbụla e gburu ọkụkọ, onye ọbụla nwere oke nke ya, bido na nna nke bụ isi ezinaụlọ ruo n’obere.

O bụ nna maọbụ diokpara, ma ọ bụrụ na nna anoghịzị ya na-ata eko ọkụkọ na obi ya. Eko ọkụkọ na obi ya na-egosị ndụ n’uju ya. Ọ bụ n’ihi nke a ka o jiri bụrụ onyeisi ezinaụlọ ga-ata ya iji gosi ọrụ ya dikaonye nọ n’isi. Nke a na eziputakwa na ọ bụ ya ka ọ dịịri ichekwa ndu ndị ezinaụlọ ya.

Ihe onye nne na-ekete n’okụkọ bụ olu ya. Nke a na-egosiputa ọrụ ya na ike o nwere dika onye nne n’ezinaụlọ. Ọ bụ olu okụkọ na-eme ka ọkụkọ tugharia isi ya were lee anya ebe ọ chọrọ ile anya ma mekwaa ihe ọ chọrọ ime. Dika onye nne, ọ bu ya na-ejikọ ezinaụlọ ya ọnụ ma mee ka ihe na-aga dịka o kwesịrị.

Ọ bụ nne na ejikọ nna na ụmụ a mụtara n’ezinaụlọ. Onye na-ata ngụgụ ọkụkọ na ukwu ya bu ada. Ihe mere ada ji ata ngugu na ukwu ọkụkụ bụ n’ihi nkwenye ndị Igbo nwere na ọ bụrụ na ada ruo ihe e ji nwaanyị eme na ọ ga-efepụ lụọ di n’ezinaụlọ ọzọ; n’ihi na ọ bụ ngụgụ ọkụkọ  ka o ji efe efe. Nke ọzọ bụrụ na  site n’inye ada ukwu ọkụkọ ndị ezinaụlọ ya na-agọrọ ya ọfọ omụmụ ma ọ lụọ di.

Ndị na-ata isi na ụkwụ ọkụkọ bụ ụmụnwoke na-etolite etolite n’ezinaụlọ. Site n’inye ha isi ọkụkụ a na-echetara ha na ọ bụ ha ga-abụ ndịịsi ezinaụlọ ahụ n’ọdịnihu. Sitekwa n’ita ukwụ ọkụkọ a na-echetakwara ha na ọ bụ n’aka ha ka nkwụdosike ezinaulọ di; ka ha site n’ịgba mbọ mee ka ezinaụlọ ha kwụdosie ike, ghara ilaghachi azu.

Ihe mmụta: Nri bụ oriko n’ala igbo. Otu ndị Igbo si eke anụ akụkọ n’ezinaụlọ ha na-egosi na onye ọbụla nwere ọrụ dịịrị ya

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484