Na Kaduna, Ọkụ Agbagbuola Nwata Akwụkwọ Nọ n'Ọdụ Mmanụ Etinye Ike Ọkụ n'Ekwentị Ya

May 28, 2021 - 21:30
May 28, 2021 - 22:21
 0
Na Kaduna, Ọkụ Agbagbuola Nwata Akwụkwọ Nọ n'Ọdụ Mmanụ Etinye Ike Ọkụ n'Ekwentị Ya

Izunna Okafor dere akụkọ a

Otu nwata akwụkwọ zùtèrè ọnwụ ike ya na nsonso a, dịka ọkụ ọgbụgba dapụtara n'ọdụ mmanụ ebe ọ nọ-etinye ike ọkụ n'ekwentị ya.

Isi ọchịchị ụlọakwụkwọ nwata ahụ, bụ 'Kaduna State College of Nursing and Midwifery' bụ ya kwupụtara ọnwụ ọnwụ nwata akwụkwọ ahụ, bụ Lydia Dantata onye nke zutere ọnwụ ya site n’ọkụ ọgbụgba nke malitere n’ọdụmmanụ ụgbọala ahụ dị na ncherita ihu ụlọakwụkwọ ya, mpaghara (campus) nke Kafanchan.

Dịka akụkọ siri kọọ, ọkụ ọgbụgba ahụ metụtàrà ụmụakwụkwọ ruru iri n'ọnụọgụgụ, bụ ndị gara n'ọdụ mmanụ ahụ etinye ike n’ekwenti ha.

Ụmụakwụkwọ ahụ ka e kwuru na ha gara ebe ahụ itinye ike n’ekwentị ha n’ihi abụbọ ọrụ nke ịdọ aka na ntị ‘Nigeria Labour Congress’ gbara abalị ise nke mere na ọkụ adịghị na steeti ahụ niile.

E kwuru na ọkụ malitere gbawa oge akụrụngwa e ji akwụnye ihe n’ọkụ (extension box) nke ụmụakwụkwọ ahụ bọkesiri ọkụ dịka ụgbọala tanka na-agbapụta mmanụ ụgbọala; o wee dọọ ọkụ ahụ, ọkụ ọgbụgba wee malite.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyenlekọta (overseer) ụlọakwụkwọ ahụ, bụ Maazị Ephraim Dyages kwuru site na Kafanchan na Dantata nwụrụ n’elekere atọ nke ụtụtụ Monde, ma bụrụkwa onye nwụrụ n’ụlọ ahụike nkụzi mahadum 'Jos University Teaching Hospital' (JUTH) ebe ya na otu nwaakwụkwọ ọzọ na-anara ọgwụgwọ.

Dyages kọwara na ụmụakwụkwọ ise ka na-anara ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ 'General Hospital, Kafanchan' ahụ ma mee ka a mara na nne na nna ụmụakwụkwọ atọ ndị ọzọ n'ime ha kwuru ka ha kpọpụ ụmụ ha ebe ọzọ.

Ótù nwata akwụkwọ zùtèrè ọnwụ ike ya na nsonso a, dịka ọkụ ọgbụgba dapụtara n'ọdụ mmanụ ụgbọala ebe ọ nọ were etinye ike ọkụ n'ekwentị ya.

Isi ọchịchị ụlọakwụkwọ nwata ahụ, bụ 'Kaduna State College of Nursing and Midwifery' bụ ya kwupụtara ọnwụ nwata akwụkwọ ahụ, bụ Lydia Dantata, onye nke zutere ọnwụ ya site n’ọkụ ọgbụgba ahụ nke mere na ncherita ihu ụlọakwụkwọ ya, mpaghara (campus) nke Kafanchan.

Dịka akụkọ siri kọọ, ọkụ ọgbụgba ahụ metụtàrà ụmụakwụkwọ ruru iri n'ọnụọgụgụ, bụ ndị gara n'ọdụ mmanụ ụgbọala ahụ maka tinye ike ọkụ n’ekwenti ha, n’ihi ịgba abụbọ ọrụ ịdọ aka na ntị ahụ ndị òtù ‘Nigeria Labour Congress’ gbara na nsonso a, nke mere na ọkụ adịghị na steeti ahụ niile.

E kwuru na ọkụ ahụ malitere gbawa oge akụrụngwa e ji akwụnye ihe n’ọkụ (extension box) nke ụmụakwụkwọ ahụ bọkesiri ọkụ dịka ụgbọala tanka na-agbapụta mmanụ ụgbọala n'ebe ahụ; o wee dọọ ọkụ ahụ, ọkụ ọgbụgba wee malite.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyenlekọta (Overseer) ụlọakwụkwọ ahụ, bụ Maazị Ephraim Dyages kwuru site na Kafanchan na Dantata nwụrụ n’elekere atọ nke ụtụtụ Monde, ma bụrụkwa onye nwụrụ n’ụlọ ahụike nkụzi mahadum 'Jos University Teaching Hospital' (JUTH) ebe ya na otu nwaakwụkwọ ọzọ nọbụ were anara ọgwụgwọ.

Dyages gara n'ihu kwuo na ụmụakwụkwọ ise ka na-anara ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ 'General Hospital, Kafanchan' ahụ ma mee ka a mara na nne na nna ụmụakwụkwọ atọ ndị ọzọ n'ime ha kwuru ka ha kpọpụ ụmụ ha ebe ahụ ma kpọga ha ebe ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484