N'Anambra, Ndị Uweojii Azọpụtala Ndị Ohi Atọ A Chọrọ Ịgba Ọkụ

Mar 14, 2022 - 22:44
 0
N'Anambra, Ndị Uweojii Azọpụtala Ndị Ohi Atọ A Chọrọ Ịgba Ọkụ


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị uweojii steeti Anambra azọpụtala mmadụ atọ a na-enyo ènyò na ha bụ ndị ohi, ma bụrụkwa ndị ụmụokorobịa atọ chọrọ ịgba ọkụ maka ohi ha zuru.

Dịka ozi a kụpụrụ site n'aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ DSP Tochukwu Ikenga, mmadụ atọ ahụ gụnyere Maazị Ifeanyi Nsiegbunam (gbara ahọ iri abụọ na atọ), Maazị Chinemelum Nwafor (gbara ahọ iri abụọ na asaa), Maazị Nnamdi Nwakwesili (gbara ahọ iri anọ), ma bụrụkwa ndị e kwuru na ha jidere otu nwata akwụkwọ Mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu, Igbariam, ma zuo ya ohi, nakọrọsịa ya ihe niile o ji.

O kwuru na ndị ahụ iwe juru obi jidere mmadụ atọ ahụ ụbọchị Tuesday, tie ha gwoogwoo, ma chọzie ịgba ha ọkụ, tupu ndị uweojii wee wụchaa n'ebe ahụ, ma zọpụta ha n'aka ndị ahụ.

Ọ kọwakwara na ihe dị icheiche e nwetesiri n'aka ahụ gụnyere otu nsụnsụ egbe, otu daga, akụrụngwa e ji ebe osisi (saw), akpaaka nwaanyị, ekwentị Infinix, na kwentị Pansonic, tinyere ụfọdụ ihe ndị ọzọ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP Echeng Echeng dụrụ ndị Anambra ọdụ ka ha kwụsị iji aka ha egbu mmadụ a na-enyo ènyò na o mere otu ihe maọbụ nke ọzọ. Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha na-akpọtụrụ ndị uweojii oge ọbụla ha jidere onye ohi, ka ha wee bịa kpụrụ onye ahụ, mee nnyocha kwesiri ekwesi, ma jiri usoro iwu nye ya ntaramahụhụ kwesiri ya.

O kwezịrị nkwà na a ga-eme nnyocha miri èmi banyere arụrụala ahụ e kwuru na ndị ahụ rụrụ, ma kpụpụ ha ụlọikpe ngwangwa e mechara nnyocha banyere arụrụala ha.

Ọ dị ncheta na ụmụokorbịa iwe juru obi nọrọ n'izuụka gara aga, jide mmadụ atọ a na-enyo ènyò na ha zuru ohi ekwentị n'Onitsha, ma gbaa ha ọkụ ozigbo, tupu ndị uweojii bịaruo ebe ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484