N'Anambra, Ndị Ụka Ekpeela Ekpere Maka Ezi Nchekwa, Gọzie Ọchịchị Soludo

Apr 8, 2022 - 20:00
 0
N'Anambra, Ndị Ụka Ekpeela Ekpere Maka Ezi Nchekwa, Gọzie Ọchịchị Soludo

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-abụ anụ gbaa ajọ ọsọ, a gbaa ya ajọ egbe, maka na ọ na-adị mma akpụ kwụọ ụdọ, a chọọrọ ya mmiri oyi.

N'ịgbaso nke a, ụlọụka dị icheiche na steeti Anambra nọrọ na nsonso wee chịkọba ọgbakọ ekpere pụrụ iche, iji bute ọnọdụ nchekwa steeti ahụ n'ihu Chineke ma rịọka ya maka mgbataọsọ Ya.

Ya bụ ọgbakọ ekpere pụrụ iche bụ nke gọọmenti steeti Anambra tụpụtara ma nye ntụziaka ka e mee; ma bụrụkwa nke dayọsiisi na ụlọụka dị icheiche n'ime steeti ahụ mere na mpaghara ha dị icheiche.

Ọgbakọ ekpere ahụ bụkwa nke ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba izu na ndị ọnụ na-eru n'okwu na steeti Anambra sonyere na ya, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee kpee ekpere maka udo, maka ịkwụsị iwu ‘onye apụtakwala iro’ ahụ a na-edebe na steeti ahụ ụbọchị Mọnde ọbụla, ya na iweta ezi nchekwa na ọnọdụ mmepe tọrọ àtọ na steeti ahụ.

A nọkwa n'ọgbakọ ekpere ahụ wee gọzie ma chee ọchịchị Gọvanọ Chukwuma Soludo na osote ya bụ Dọkịta Onyekachi Ibezim n'ihu Chineke.

Ebe dị icheiche ya bụ ekpere ahụ weere ọnọdụ na steeti ahụ ụbọchị gụnyere ụlọụka ‘St. Faith Cathedral, Awka’, ụlọụka ‘Church of Holy Spirit, Paul University, Awka’;  ụlọụka ‘St. Patrick’s Cathedral, Awka’; ụlọụkwa ‘St. Joseph's Cathedral, Ekwulobia’, tinyere ọtụtụ ebe ndị ọzọ.

N'okwu ya n'ụlọụka St. Joseph's Cathedral, Ekwulobia’ dị n'okpuruọchịchị Aguata, ebe ya onwe ya sonyèrè n'ọgbakọ ekpere ahụ, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo kèlere ndị dị icheiche sonyere n'ọmarịcha mmemme ahụ n'ụlọụka ha dị icheiche, ma kwupụta olileanya o nwere na ya bụ ọgbakọ ekpere ga-amịta ezi mkpụrụ a tụrụ anya, ma mekwa ka nsogbu ajọ ọnọdụ nchekwa ahụ malitere ọhụrụ na steeti ahụ bịa na njedobe oge adịghị anya.

Ọ nọkwazịrị n'ebe ahụ wee dụọ ndị na-etinye aka n'ụdị mpụ na arụrụala dị icheiche na steeti ahụ ka ha sepu aka na nke ahụ, ma rịọkwa ndị ji maka ịkpọ ganịganị wee na-egbusi maọbụ emebisi ihe ndị mmadụ ka tinye mma ha n'ọbọ ma gbasoo udo na mkpezi, n'ihi na o nweghị nsogbu a pụghị ikpezinwu n'ụzọ udo.

Ọ gwara ndị na-eti iwu ‘onye apụtakwala iro’ ụbọchị Mọnde ọbụla na steeti ahụ ka ha kwụsị ime nke ahụ, ma dụkwa Ndị Anambra ka ha kwụsị irube isi n'iwu ahụ esighị n'aka gọọmenti, ọkachasị n'ihi ọtụtụ ụzọ dị icheiche nke ahụ si emetụta ha, azụmahịa ha, ọnọdụ obibindụ ha na ọnọdụ akụnụba steeti ahụ ka ọ dị taa.

O kwukwazịrị ka a mara na ọchịchị ya nwere ezi ebumnobi inwòghàrị steeti ahụ na ime ya ka o guzosie ike, nwee ezi ọnọdụ nchekwa, ma chawapụkwa ka ihè, ọbụladị dịka ọ rịọzịrị ndị Anambra ka ha nye aka ime ka nrọ ya ahụ na ezi ebumnobi ya ahụ pụta ihè na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484