Asọmpi Egwuregwu Ndị Ntorobịa APGA Amalitela n'Ụkpọr

Sep 17, 2020 - 22:16
Jan 28, 2021 - 22:16
 0
Asọmpi Egwuregwu Ndị Ntorobịa APGA Amalitela n'Ụkpọr

Si n'aka Izunna Okafor

A kpọkuola ndị ntorobịa ka ha gbalịsie ike tinye ọnatarachi na akaraka Chukwu jiri gọzie ha n'ọrụ, ma were ya bàára onwe ha úrù, ma wèta mmepe obodo n'izugbe.

Òkù a bụ nke a kpọrọ site n'ọnụ Kọmishọna na-ahụ maka ọchịchị ime obodo na echichi ọdịnala n'ime steeti Anambra, bụ Maazị Greg Obi, n'okwu ya na mmemme ịgbape asọmpi egwuregwu ndị ntorobịa otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressive Grand Alliance (APGA)' n'ime okpuru ọchịchị ime obodo 'Nnewi South', bụ nke weere ọnọdụ n'Ukpor, bụ isi obodo okpuru ọchịchị ahụ.

Maazị Obi, nke ọ bụ Maazị Kingsley Oforma, nọchitere anya ya na mmemme ahụ, kọwàrà asọmpi egwuregwu ahụ dịka atụmatụ magburu onwe ya, n'ihi ọtụtụ uru dị iche iche ga-esi na ya pụta, ihe ọma dị iche iche nke ahụ pụrụ iwètàrà ndị ntorobịa, nakwa ụzọ dị iche iche nke ahụ pụrụ isi tụnye ụtụ n'ịkwàlite mmepe obodo. O kèlèkwàzịrị ndị ndu otu ndọrọndọrọ APGA n'okpuru ọchịchị 'Nnewi South', ma kpọkuo ha ka ha jisie ike n'ọrụ, ọbụnadị dịka ọ dụrụ ndị ntorobịa ahụ ọdụ ka ha wèré ohere ọma asọmpi ahụ gosipụta ọnatarachi ha.

Na mbụ n'okwu mmalite ya, onyeisioche nchere oge n'okpuru ọchịchị Nnewi South, bụ Maazị Chieloka Okoye (onye ọ bụ ya na Kọmishọna Obi mèrè mgbape asọmpi ahụ) kwùrù na ebumnobi mmemme ahụ bụ iji kwàlite ịdịnootu, mee ka ndị ntorobịa ahụ bàárá onwe ha úrù, ma nyekwa ha ya ohèrè igosipụta ọnatarachi ha, tinyere ọtụtụ ihe ọma dị iche iche ga-esi na ya pụta.

Ọ kpọkùrù ndị ntorobịa ahụ ka ha were ohere ahụ kpọrọ ihe, n'ihi na onye ọbụla n'ime ha nwèrè ohèrè isi ebe ahụ gbagoo n'ogoogo dị elu, ma gwakwa ha ka ha gaa n'ihu ịkwàdò otu ndọrọndọrọ ọchịchị APGA nà ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ, bụ nke nwere ọmarịcha ebumnobi na atụmatụ bànyere ndị ntorobịa steeti ahụ.

N'ajụjụ ọnụ Ka Ọ Dị Taa gbara ya, onye jibụrụ ọkwa dịka onyeisioche nchere oge n'okpuru ọchịchị ahụ, bụ Maazị Felix Odumegwu kọwara egwuregwu bọọlụ dịka ihe bara oke uru, ma kwuo na asọmpi ahụ ga-enye aka ibèlata arụrụala n'obodo, mee ka ndị ntorobịa bàára onwe ha na obodo ha úrù, ma mekwazie ka ha gosi ụwa ọnatarachi ha.

Ọ kọwara na e mebụọla ụdịrị asọmpi ahụ n'ahọ 2017 oge ya onwe ya nọ n'ọkwa ọchịchị, bụkwa nke mịtara ọtụtụ mkpụrụ ọma dị ichè ichè. O kwukwara na onye ọbụla bụ onye ntorobịa n'okpuru ọchịchị ahụ tozuru òkè ma nwekwa mmasị, nwèrè ohere isonye n'asọmpi ahụ, n'agbanyeghị otu ndọrọndọrọ ọchịchị onye ahụ nọ na ya.

N'okwu nke ya, onye na-anọchi anya ọgbọ nta nkwàdo 'Nnewi South' nke mbụ n'ụlo omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Sonny Ozobialu kwuru na mmemme ahụ bụ nke na-egosi n'eziokwu na APGA bụ onye aghàna nwanne ya, ma kwupụtakwa olilieanya o nwèrè na a ga-esite na ya chọpụta ndị ntorobịa a ga-esite n'aka ha wee na-anụ aha okpuru ọchịchị ahụ n'ihe gbasaara egwuregwu n'ogoogo mba ụwa.

Onye ndu ndị ntorobịa APGA na 'Nnewi South' bụ Maazị Chibueze Alaehobi kwuru na asọmpi ahụ ga-adịru ihe dịka otu ọnwa, ma kwukwa na ọ ga-enye aka ijikọtakwa ndị ntorobịa okpuru ọchịchị ahụ ọnụ ọzọ, bụ ndị gbasasịrị ka mkpụrụ ụkpaka ma chịkpusie ọkpa n'ime ụlọ kemgbe ọnwa ole na ole gara aga n'ihi ọrịa nje korona.

Igbo sị na ọ na-abụ dike zùte dike ibè ya, a mara akanwụ na ụtabà nke na-akpọlite uzere. N'ihi nke ahụ, ndị wọọdụ nke isii Ụkpọr nọrọ na asọmpi mbụ ahụ wééré ọnọdụ ụbọchị ahụ wee gosi ndị Osumenyi na nwoke na ibe ya hà bụ n'ọnụ, site n'iji ọkpụ atọ a saghị asa wee sị ha ladị mma.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.