E Nyela Ndị Ajadụ Na Ụfọdụ Ndị Nne Ọzụzụ Maka Ịkwụrụ Onwe Ha

Jun 27, 2022 - 22:58
 0
E Nyela Ndị Ajadụ Na Ụfọdụ Ndị Nne Ọzụzụ Maka Ịkwụrụ Onwe Ha

Izunna Okafor dere akụkọ a

A kpọkuola ụmụnwaanyị ajadụ na ụmụnwaanyị ndị mụrụ nwa na-alụghị di ka ha guzosie ike ma gbasikwa mbọ ike n'onwe ha iji bụrụ ndị kwụụrụ onwe ha ma na-achụtanwukwa ihe ha na ndị ezinụlọ ha ga na-eri na-adabereghị n'onye ọbụla.

Oku a bụ isi sekpụ ntị na mmemme inye ọzụzụ na nkụzi otu ụbọchị a chịkọbara maka ụmụnwaanyị ahụ, bụkwa nke weere ọnọdụ n'Awka na nsonso a, ma bụrụkwa nke isiokwu ya bụ “Maka Gịnị Ka Ị Ga-Eji Nọdụ Ebe A? Gịnị Ọzọ?.

Ya bụ mmemme inye ọzụzụ bụkwa nke ọ bụ ndị òtù ‘Futureholds True Value-Impact Foundation’ chịkọbaara ụmụnwaanyị ahụ.

N'okwu ya n'ebe ahụ, onyeisi ndị òtù ahụ, bụ Oriakụ Ncheta Chidubem-Nwachinemere kwuru na ebumnobi ọzụzụ ahụ bụ iji gbanweer ọnọdụ ụmụnwaanyị ahụ nà akụkọ ndụ ha, dịka o siri metụta ihe dị icheiche chere ha n'ihu na ihe ha na-agabiga. Ọ kọwara na òtù ahụ na-elekwasị anya n'ihe dị icheiche metụtara ịkwàdó na ime ka mmadụ kwụrụ onwe ya, ma ụmụ na-eto na ndị ntorobịa enweghị nne na nna,  ụmụnwaanyị, ọkachasị ụmụnwaanyị ajadụ na ụmụnwaanyị ndị ọzọ mụrụ nwa n'enweghị di; ma sịkwa na ha na-eme ka ndị dị otu a bụrụ ndị na-agbasi mbọ ike ma na-enyekwa, ma sikwazie n'ụzọ dị etu ahụ na-atụnye ụtụ n'ịkwalite mmepe na ọdịmma obodo.

Ọ kpọkukwazịrị ụmụnwaanyị ahụ sonyere n'ọzụzụ ahụ ka ha tinye ihe dị icheiche ha mụtara ebe ahụ n'ọrụ ma jirikwa ihe dị icheiche a kụziiri ha nyere onwe ha na ezinụlọ ha aka.

Na mbụ na nkụzi ya, onye ọbịa nyere nkụzi na mmemme ahụ, Maazị Paul Umeokoli kọwaara ụmụnwaanyị ahụ mkpa ọ dị ha ịbụ ndị na-ekepụta akụnụba ma nwee ihe bara uru ha na-eme, ka ha wee ghara ịdaba n'ọnọdụ ọjọọ, ihe egwu, maọbụ ihe izendụ ọbụla nwere ike ịdabụta site na ha ịdabere na mmadụ maọbụ tụkwasị obi n'ịchọ onye ga-enyere ha aka.

Ọ gwakwara ha ka ha ghara ịbụ ndị ‘ọbanaka ọbanọnụ’, kama ka ha bụrụ ndị ma echekwa ego nke ọma ma na-echekwa ọbụladị obere ego ha na-enwete site n'ihe dị icheiche ha na-eme.

Ụfọdụ ndị ọzọ nyere nkụzi na mmemme ahụ, nke gụnyere Ọkaiwu Faith Nwabachili, na Oriakụ Blessing Achebe nyere ụmụnwaayị ahụ nkụzi usoro dị icheiche ha ga-agbaso oge ọbụla mmadụ megidere ikike dịịrị ha, ma gwakwa ha ka ha kwụsị ịdabere maọbụ ịtụkwasị obi na mmadụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484