Òtù ASATU Enyela Ụfọdụ Ndị Ọrụ Gọọmenti Nkwanyeugwu

May 13, 2022 - 08:08
 0
Òtù ASATU Enyela Ụfọdụ Ndị Ọrụ Gọọmenti Nkwanyeugwu

Izunna Okafor dere akụkọ a

Òtù ahụ jikọtar ndị ndu obodo dị icheiche dị na steeti Anambra, a maara dịka ‘Anambra State Association of Town Union (ASATU)’ nọrọ na nsonso a wee nyee nkwanyeugwu nyeagara ụfọdụ ndị ahụ a kpọlitere n'ọkwa dị icheiche na steeti ahụ.

Mmemme inye nkwanyeugwu ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ọgbakọ ndị otu ahụ mere na nsonso a, bụkwa ọgbakọ ha na-eme kwà ọnwa ọbụla.

N'okwu ya na mmemme ahụ, onyeisi òtù ASATU, bụ Ọkaiwu Titus Akpudo mere ka a mara na ha dị njikere ịdọnyere gọọmenti ukwu n'ọrụ mmepe o ji n'aka na steeti ahụ na ịkwàdò ya ezi atụmatụ dị icheiche ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ hi n'aka iji dozie steeti ahụ.

O mere ka a mara na otu n'ime ihe kacha ebi ọchịchị gọọmenti aka ọjọọ bụ ịgbakụta ndị nọ n'ime-ime obodo ahụ, ma mee ka o doo anya na gọọmenti ọbụla gbakụtara ndị nọ n'ime-ime obodo azụ agaghị enwenwu ike ịchị ezi ọchịchị na imezupụta ebumnobi ya.

O mekwazịrị ka a mara na otu ahụ kwụ chịm inye ọchịchị Gọvanọ Chukwuma Soludo ezi nkwàdo, ka o wee mee nke ọma n'ọchịchị ya.

Banyere nkwanyeugwu ahụ ha nyere ụfọdụ ndị ọrụ gọọmenti, bụkwa ndị ha chiri echichi ụbọchị ahụ dịka Ndị Nnọchianya (National Ambassador) nke òtù ahụ, Maazị Akpudo kọwara ya dịka nke kwesiri ekwesi nà nke ebumnobi ya bụ iji kelee ha maka ezi ihe dị icheiche ha mepụtagoro, ya na iji mekwa ka ha bụrụ ndị nnọchianya otu ahụ n'ezie, ma na gọọmenti ma n'ebe ọbụla ha hụtara onwe ha.

Ndị ahụ e nyere nkwanyeugwu ahụ gụnyere Kọmishọna na-ahụ maka ọchịchị ime-ime obodo, bụ Maazị Tony-Collins Nwabunwanne; Kọmishọna na-ahụ maka ihe metụtara ụmụnwaanyị na ọdịmma ọhaneze, bụ Oriakụ Ify Obinabo; Kọmishọna na-ahụ maka nkwàlite ndị ntorobịa, bụ Maazị Patrick Aghamba; onye ji ọkwa osote onyeisi ndị ọrụ nye Gọvanọ, bụ Maazị  Chinedu Nwoye; tinyere onye ndụmọdụ pụrụ iche nye gọọmenti n'ihe gbasaara nkwàlite ndị ntorobịa, bụ Dọkịnt Nelson Omenugha.

N'okwu ha n'otu n'otu, ndị ahụ e nyere ya bụ onyeinye nkwanyeugwu kèlèrè ndị òtù ahụ, kwe nkwà ịbụ ezi ndị nnọchianya ASATU, ma chetakwara ha na ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ nwere ezi ebumnobi maka ndị bi n'ime-ime obodo, rịọkwazie ha ka ha kwàdo gọọmenti site n'inye aka ịgbasa na imezupute atụmatụ ya n'ime obodo dị icheiche.

Ndị ASATU nọkwazịrị na mmemme ahụ wee nye onyinye ego dị otu nde naịra nyegara otu nwaanyị ajadụ, bụ nwunye onyeisi ọchịchị obodo Nanka e gburu egbu, iji tie ya aka n'obi maka ọnwụ di ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484