N'Anambra, Ndị Ọkịja Akpụọla Arụsị Maka Mpụ na Arụrụala

Jun 20, 2022 - 21:52
Jun 20, 2022 - 21:57
 0
N'Anambra, Ndị Ọkịja Akpụọla Arụsị Maka Mpụ na Arụrụala


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-abụ anụ gbaa ajọ, ọsọ a gbanyere ya ajọ egbe, maka na ọ na-abụ anụ febe ebeghị ebe, dinta agbaba atụghịa atụ.

Ka ọ dị taa, ndị obodo Okija, dị n'okpuruọchịchị ime obodo Ihiala, nke steeti Anambra ejirila otu olu kwekọrịta ma kpụọ arụsị megide mpụ na arụrụala na ajọ ihe ndị ọzọ dị icheiche na-eme na mpaghara ahụ na gburugburu ya, ọkachasị mkpamkpa ndị ojiegbe (Unknown Gunmen) na-akpa, igbu ọchụ̀, ịtọrọ mmadụ, na arụrụala ndị ọzọ.

Ịkpụ arụsị ahụ bụ nke e mere na nsonso a, ma bụrụkwa nke gbásàrà ka ụkpaka n'onyoonyoo, site n'usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ, ebe a hụrụ ndị obodo ahụ ka ha nupụtara n'ìgwè wee sonye na ya, ma ụmụnwoke, ụmụnwaanyị, ndị ntorobịa, na ndị dibia na eze nwaanyị dị icheiche nọ n'obodo ahụ.

Ndị ahụ kpụrụ arụsị iri na ise dị n'Okija, nke gụnyere Ogwugwu-Akpụ, Ụlasị, Ogwugwu-Abọgụ, Ogwugwu-Mmiri na ndị ọzọ, bụkwa nke ha mere n'ogologo okporoụzọ niile dị n'obodo ahụ. Ka ha na-akpụ ya bụ arụsị, ha na-ekwubikwa okwu ma na-ezipukwa abụmọnụ dị icheiche megide onye ọbụla ọzọ nwara anwa soro gbaa izu maọbụ tinye aka n'ime ihe ọbụla bụ mpụ na arụrụala n'obodo ahụ, ọbụladị dịka ha na-akpọkukwa arụsị iri na ise ahụ ka ha buso onye dị etu aghụ agha ma memilakwa ya na mmụọ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ọdịnala n'Ọkịja, bụ onyeisi ime mmụọ nke otu Ezi-Ọdịnamma Okija, bụ Ọzọ Calistus Ahize (Onatara Dike Nma) kwuru na o teela obodo ahụ jiri busobe ajọ ọnọdụ nchekwa agha, ma kwukwa na ala Ọkịja dị ọkụ ugbua megide ndị na-etinye aka na mpụ na arụrụala n'obodo ahụ, bụ ndị o kwuru na ọtụtụ n'ime ha bụ ndị mba. O kwukwara na ọkụ ka ọkụ na agha ime mmụọ ka na-abịakwa n'ihu ugbua ịdakwàsị ndị ọbụla na-eme maọbụ na-akwàdó mpụ na arụrụala n'obodo ahụ, n'agbanyèghị onye ebe onye ahụ bụ, maọbụ obodo o si.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na arụsị niile ahụ ebidola ọrụ ozigbo ibu agha megide  ịtọrọ mmadụ, igbu ọchụ, mkpamkpa ndị ojiegbe, bụ nke ọtụtụ ndị na-eme ha gbagokwara ọsọ ugbua pụọ n'obodo ahụ, ma sịkwa na ozu ka ozu ka ga-ada oge adịghị anya ma ọ bụrụ na ndị na-eme ihe dị otu ahụ n'obodo ahụ esepụghị aka na ha maọbụ kwakọrọ ngwongwo ha pụọ n'Ọkịja.

Ọ dị ncheta na kemgbe ahụ ndị ọrụ nchekwa na ndị ojiegbe kwàchàrà mgbọ dị égwù n'obodo Ihiala na nsonso a, nke e sitere na ya gbagbuo ọtụtụ ndị ojiegbe ahụ ma jidekwa ụfọdụ ndị otu ha na ndị ọzọ ha na ha na-arụkọ ọrụ, nà ụfọdụ ndị dibịa na-agwọrọ ha ọgwụ gbapụrụ n'Ihiala, wee gbaga n'obodo Ọkịja, bụkwa ebe ha nọ wee gaa n'ihu na-arụ ọrụ ọjọọ ha; bụkwazị nke mere ndị obodo ahụ jiri kpebie ma were otu olu kwekọrịta maka ịkpụ arụsị ahụ, maka na mmadụ agaghị anọkwa be ya nọpịara mkpụrụ amụ.

Lee onyoonyoo ya ebe a:

Files

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484