E Meela Ụbọchị Ndị anyarị n'Anambra, Kpọọ Gọọmenti Oku Nkwàdó

Jun 17, 2022 - 21:04
 0
E Meela Ụbọchị Ndị anyarị n'Anambra, Kpọọ Gọọmenti Oku Nkwàdó

Izunna Okafor dere akụkọ a


A kpọkuola gọọmenti s n'ogoogo dị icheiche ka ha nyere ndị anyarị aka n'ihe dị icheiche ha na-agabiga, ya na iji hụ na mbọ dị icheiche ha na-agba iji gbochie ọrịa kansa ime ha mị̀tàrà mkpụrụ a tụrụ anya.

Onyeisioche òtù ahụ jikọtara ndị ọrụsị na steeti Anambra, bụ Ọkaiwu Chuks Ezewuzie bụ ya kpọrọ oku a  n'okwu ya na mmemme imerube Ụbọchị Ndị Anyarị na Mba Ụwa, nke ahọ 2022, bụkwa nke weere ọnọdụ n'ogige ‘Dora Akunyili Women Development Centre’ dị n'Awka, bụ isi obodo steeti Anambra. 

N'okwu ya na mmemme ahụ, nke isiokwu ya bụ ‘Ijikọta Aka Iji Mee Ka A Nụ Omu Anyị’, Ọkaiwu Ezewuzie gbarụrụ ihu banyere etu ụfọdụ gọọmenti n'ebe dị icheiche si eleghara ndị anyarị anya, ya na ihe dị icheiche ha na-agabiga; ma kpọọ òkù ka e belata nke ahụ, maka na ndị anyarị bụkwa mmadụ Chukwu kere eke n'ụdị nke ha ka ha bụ.

Ọ gwara ọtụtụ ndị anyarị bịara mmemme ahụ ka ha ghara imechi ọnụ ha maọbụ gba nkịtị, kama ka ha mee ka ụwa nụ olu ha, iji mee ka e nwee mgbanwe n'etu ndị mmadụ si ahụta ha nà n'ihe dị icheiche abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu maọbụ na-eche banyere ha. Ọ gwakwara ha ka ha na-eleru onwe ha anya nke ọma, na-ebi ndụ gbasiri ike, ma zèkwara ịnọ n'oke anwụ maọbụ ime ihe ndị ọzọ pụrụ iwetara ha ajọ ọnọdụ ahụike.

Ọ gàrà n'ihu kpọkukwazie ndị nne na nna nwere anyarị ka ha na-eleru ha anya nke ọma oge niile, ma gharakwa iji ahụike ha gwurie egwu, n'ihi na nke ahụ pụrụ iweta ọrịa maọbụ ọnwụ mberede.

N'okwu nke ya, nwa amadi ahụ bụ onye nnọchianya ala Nigeria na mba South Africa n'oge mbụ, bụ Uche Ajulu kelere ndị chịkọbara ya bụ mmemme; ma gwa ndị otu ahụ jikọtara ndị anyarị na steeti Anambra ka ha gba mbọ na-eme ka ozi gbasaara ha na mmemme ọbụla ha na-eme na-eru gọọmenti ndị, ọkachasị isi ụlọọrụ na-ahụ maka ahụike, isi ụlọọrụ na-ahụ maka agụmakwụkwọ, na ụfọdụ ụlọọrụ ndị ọzọ, ma n'ogoogo steeti, ma n'ogoogo gọọmenti etiti.

Ọ kpọkwazịrị òkù ka a gba mbọ hụ na e nwere ezi amụma iwu maka nchekwa ikike dịịrị ndị anyarị na steeti dị icheiche.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484