Eze Ọdịnala Ọmọr Emeela Emume Ncheta Ahọ Anọ O Jiri Banye n'Ọkwa

Dec 17, 2021 - 22:33
 0
Eze Ọdịnala Ọmọr Emeela Emume Ncheta Ahọ Anọ O Jiri Banye n'Ọkwa

Izunna Okafor dere akụkọ a

Eze ọdịnala Omor dị n'okpuruọchịchị ime obodo Ayamelum, bụ Igwe Chris Chidubem emeela emume icheta na o ruola ahọ anọ kpọmkwem o jiri banye n'ocheeze dịka eze ọdịnala obodo ahụ, bụkwa ahọ anọ nke udo na ọganihu jupụtara n'ime ya.

Ya bụ oke mmemme bụ nke weere ọnọdụ n'òbí eze ọdịnala ahụ, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ụmụafọ obodo ahụ, ndị òtù dị icheiche, ndị ichie na ọtụtụ ndị ọzọ sikwa ebe dị icheiche wee bịa isonye na ya.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Igwe Chidubem kwupụtara obi ụtọ ya, ma nyekwa Chineke ekele maka ọrụ ọma dị icheiche o ji ya arụ n'obodo ahụ kemgbe ahọ anọ gara aga, kelekwazie ụmụafọ obodo ahụ maka ezi nkwàdo ha na ekpere ha nyegara ọchịchị ya, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ha ka ha gaa n'ihu ime nke ahụ.

O mere ka a mara na a hazighị mmemme ahụ n'ụdị dị ukwuu dịka o siri kwesi, ma kọwaa na nke ahụ bụ n'ihi nsogbu ahụ dapụtagasịrị n'ime obodo ahụ n'ime ọnwa olenaole gara aga. Ọ kọwakwara na ha ji ohere mmemme ahụ wee na-enwe nzukọ ma na-etinye ọnụ n'okwu gbasaara ụfọdụ nsogbu na ihe iche aka mgba dị icheiche na-eche na-echere obodo ahụ ugbua, nà etu a ga-esi wèta ha n'isi njedobe. Ọ gakwara n'ihu wee kwuo na ọ gaghị ada mbà inye ụmụafọ ahụ ezi ọchịchị bụ ịgbà site n'inye aka ha, nkwàdo nà ekpere ha.

O jàrà obodo ahụ mma maka etu ha si akọsi ọrụ ugbo ike, ma na-emepụtakwa erimeri gbaanyụụ, gwa ha ka ha jide ka ha ji, ọbụladị dịka ọ rịọkwazịrị gọọmenti ka ha welitekwuo aka n'ịrụ okporoụzọ n'obodo ahụ iji nyere ụmụafọ obodo ahụ aka ịdị na-ebuputesi ihe ha kọtara n'ugbo n'enweghị ihe nhịahụ ọbụla.

N'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ banyere mmemme ahụ na ọgbakọ ha nwere, onyeisi otu jikọtara ụmụada Omor-Anukwu, bụ Oriakụ Jacinta Nnechi kọwara na obodo ahụ ejirila otu olu wee kwekọrịta na ha ga-arụ ogige nlekọta maka ndị na-akpọ ọgwụike na ndị ọzọ ọgwụike megoro ihe chọrọ ka a zọpụta maọbụ nwògharịa ha.

Ọ kpọpụtasịkwara ihe ndị ọzọ dị icheiche ha tinyere ọnụ na ya ụbọchị ahụ, ọmarịcha atụmatụ dị icheiche ha tụpụtara na nkwekọrịta ndị ọzọ ha mere banyere obodo ahụ na ọdịmma ya; ma gosipụtakwa ezi olileanya o nwere na obodo ahụ ga-aga n'ihu na-akawanye mma.

Na ntụnye nke ha n'otu n'otu, ụfọdụ ndị ichie obodo ahụ, nke gụnyere Maazị Emma Udegbuna na Dọkịta Amobi Chiamogu jikwazịrị ohere ahụ wee kpọkuo ụmụafọ obodo ahụ ka ha na-ewete mkpesa banyere ịzọ oke ala, nsogbu ndị ọzọ maọbụ ihe iche aka mgba ọbụla ha hụtara, karịa iji aka ha wee na-eme ihe iwu akwadoghị. Ọ gwakwara ụmụafọ obodo ahụ ka onye ọbụla gbaa mbọ rụọ ụlọ mposi na be ha dị icheiche, iji belata arụrụnsị na mmetọsị gburugburu n'obodo ahụ.

N'ozi ekele ha n'otu n'otu, Maazị Clement Nonyelum na Oriakụ Charity Tagbo-Nzekwesi gbara akaebe ma kọkwa akụkọ ọgbụgbama banyere mmepe na ihe ọma ndị ọzọ dị icheiche batagoro n'obodo ahụ kemgbe Igwe Chidubem siri banye n'oche dịka eze ọdịnala obodo ahụ, ma kpekwazie ka Chineke gaa n'ihu inye ya ezi ọnọdụ ahụike, ogologo ndụ na amamihe iji wee na-edu ha nke ọma.

A nọrọ na mmemme ahụ, gụọ ma gbaa egwu dị icheiche site n'aka ụmụada obodo ahụ, rie ma ñụọ, nyekwa Igwe Chidubem onyinye site n'aka ndị otu dị icheiche, tinyere ihe ndị ọzọ mere ka mmemme ahụ magbuo onwe ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484