Sinọọdụ Dayọsiisi Agụata: Soludo Adụọla Ndị Ụka Ka Kwalite Ịdịnotu

Jun 7, 2022 - 21:48
 0
Sinọọdụ Dayọsiisi Agụata: Soludo Adụọla Ndị Ụka Ka Kwalite Ịdịnotu

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo akpọọla oku ka a kwalite ịdịnotu, ezi mmekọrịta na njikọaka n'etiti ndị òtù ụka dị icheiche, iji nye aka n'ibuli steeti ahụ na ọchịchị ya n'ogoogo dị elu na n'imegide ihe dị icheiche na-echere steeti ahụ nà ndị òtù Kraịst aka mgba n'oge ugbua.

Gọvanọ Soludo kpọrọ oku a n'okwu ya na mmemme e ji chịkọta nnukwu ọgbakọ sinọọdụ ahọ 2022 nke ụka Angịlịkan na dayọsiisi Aguata.

Ya bụ nnukwu ọgbakọ sinọọdụ bụ àgbà nke atọ nke sinọọdụ nke iri na abụọ nke dayọsiisi ahụ, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n'ụlọụka ‘St. James' Church, Nanka’ dị n'okpuruọchịchị ime obodo ‘Orumba North’, nke steeti Anambra.

N'okwu ya n'ụka ịtụ mmamma e jiri chịkọta ya bụ sinọọdụ, Gọvanọ Soludo kwupụtara mkpa ọ dị ijikọta ọnụ n'etiti ndị ụka, ma chetakwara ndị sonyere na ya bụ mmemme ihe mgbadoụkwụ nke ọchịchị ya na-elekwasị anya na ya, nke bụ otu steeti, otu ndị mmadụ, na otu ebumnobi.

O mere ka a mara na ozi ahụ o ziri ọhaneze steeti ahụ na nsonso a nà ntụziaka dị icheiche o nyere a ga-agbasa wee memilaa ajọ ọnọdụ nchekwa na-echere steeti ahụ na ụmụafọ ya emeela ka ndị ọrụ nchekwa wèlitekwuo aka n'ọrụ iweghàchi ezi ọnọdụ nchekwa na steeti ahụ, nke na ha na-awagharịzị ugbua na gburugburu steeti ahụ, ma na-achọgharị ndị omekoome ahụ ka ha buso ha agha, ọkachasị n'ebe dị icheiche ha nwere ebe nzuzo, nàkwà ebe ha na-anọ arụ arụrụala dị icheiche ma na-eyikwa ndị mmadụ egwu na gburgburu niile nke steeti ahụ.

Dịka ọ na-echetara ọhaneze na ọrụ nchekwa bụ ọrụ dịịrị mà onye ukwu mà onye ntà n'ihi na onye ọbụla nwere ntụnye ọ ga-eme na ụzọ ọ ga-esi nye aka; ya bụ Gọvanọ, onye duru nwunye ya bụ Oriakụ Nonye Soludo wee bịa mmemme ahụ, kpọkùkwàzịrị ndị Anambra ka ha na-enye ndị ọrụ nchekwa ozi dị mkpa ga-enye aka ịkwàlite arụmọrụ ha, ọkachasị oge ha hụrụ onye na-aga ije dị añaa.

O kwere nkwà na ọ ga-aga n'ihu ịrụ ezi ọrụ na steeti ahụ, ọkachasị ọrụ ịkwàlite nchekwa na ezi ọnọdụ obibi ndụ ụmụafọ steeti ahụ, ya na ọrụ ịkwàlìtè ezi ọnọdụ mmepe na ọganihu bụ ịgbà na steeti ahụ, n'agbànyèghị na ego dị n'akpa steeti ahụ ebuchàghị ibu.

Na mbụ n'ozi ọ gụpụtara na mmemme ahụ, Bishọọp ụka Angịlịkan na Dayọsis Agụata, bụ ‘Rt. Rev.’ Samuel Ezeofor kèlèrè Chineke maka etu nhọpụta ọkwa gọvanọ e mere na steeti ahụ n'ahọ gara aga siri wee gaa nke ọma, bụ nke e sitere na ya wee họpụta ma guzobe Gọvanọ Soludo na osote ya, dịka o siri bụrụ mmasị Chineke. 

O chètààrà ya bụ Gọvanọ ụmụafọ steeti Anambra na-atụ anya ọtụtụ ihe n'aka ọchịchị ya ma na-elegara ya anya ka onye ma nke ekwe na-akụ n'ihe gbasaara ọchịchị. Gbasaara etu ọnọdụ nchekwa siri dị na steeti ahụ ugbua, Bishọọp gwàkwà Gọvanọ Soludo na ndị Anambra ka nwere ntụkwàsịobi ma kwenyesie ike na ọchịchị ya wàtàrà ọgọdọ ma nwekwa ihe ọ ga-ewè iji memìlaa ndị omekoome ahụ na-eyi ụmụ mmadụ egwu ma weghàchitekwa ezi ọnọdụ nchekwa na udo tọrọ àtọ na steeti ahụ.

Ọ nọkwazịrị n'ebe ahụ wee kwe ya nkwà na ndị ụka kwụ ya n'azụ ma dịkwa njikere ịga n'ihu na-enye ya nkwàdo, iji hụ na ọchịchị ya na steeti ahụ gàrà siriri-wèrèrè ma mekwa nke ọma.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484