Osote Onyeisi Uweojii Nigeria Abịala Njem Nleta na Steeti Anambra

May 23, 2022 - 00:19
May 23, 2022 - 09:45
 0
Osote Onyeisi Uweojii Nigeria Abịala Njem Nleta na Steeti Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Nwa amadi ahụ a kpọlitere ọhụrụ dịka osote onyeisi ndị uweojii n'ala Nigeria, ma bụrụkwa onye na-ahụ maka ngalaba nchọcha na nhazi n'isi ụlọọrụ ndị uweojii Nigeria dị n'Abuja, bụ DIG Ogbonna Amadi agaala njem nleta n'isi ụlọọrụ ndị uweojii steeti Anambra dị n'Amawbia, Awka, iji mara ka ọrụ si aga n'ebe ahụ, ma nwekwa mkparịtụka n'etiti ha na ndị uweojii steeti ahụ.

Ya bụ osote onyeisi ndị uweojii bụ onye a nabatara na steeti ahụ site n'aka onyeisi ndị uweojii n'Anambra, bụ CP Echeng Echeng na ụfọdụ ndị ọzọ selitere isi n'ọrụ uweojii, tinyere ndị ọrụ uweojii nọ n'isi ụlọọrụ ahụ.
N'ozi nnọ́ọ̀ ya, onyeisi ndị uweojii na steeti Anambra, bụ CP Echeng toro ma kelee DIG Amadi ekele n'ihi mkpọlite ahụ a kpọlitere ya n'ọkwa ọhụrụ ahụ nàkwà mkpọlite a kpọlitere ya dịka onyeisi na-ahụ maka mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ.

Dịka ọ na-ekele ya maka ngalaba ebe dị icheiche o jegoro ozi n'oge gara aga; CP Echeng tòkwàrà onyeisi ndị uweojii n'ala Nigeria, bụ IGP Alkali Baba Usman maka nkwàdó ọ na-enye ndị uweojii steeti ahụ, ọkachasị etu o siri hụ na e mere nhọpụ̀ta ọchịchị ọkwa Gọvanọ e mere na steeti ahụ n'ahọ gara aga nke ọma na n'ụzọ udo, n'agbànyeghị ụfọdụ ihe iche aka mgba dị icheiche dapụtara n'oge ahụ.

O gosipụtara obi mwute ya banyere etu ụfọdụ ndị omekome si akpalite ajọ ọnọdụ nchekwa na steeti ahụ nà ná mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ, ọkachasị n'ime ọnwa olenaole gara aga, bụkwazị nke o kwuru na ha na-agbasi mbọ ike iweta ya n'isi njedebe.

Na nzaghachi ya, DIG Amadi kọwàrà na ebumnobi njem mkpọtụrụ ahụ bụ iji mara ka ọrụ si aga n'ebe ahụ ma mekwa ka ha na ndị uweojii steeti ahụ mara onwe ha.

O kpere ka mkpụrụobi ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ lagoro mmụọ maọbu tụfuo ndụ ha n'ihi ajọ ọnọdụ nchekwa dị na steeti ahụ zuo ike udo; ọbụladị dịka o mere ka a mara na ọ dị mkpa iwepụ̀tà usoro bụ ị̀gbà a ga-agbaso wee wètá ajọ ọnọdụ nchekwa ahụ dị na steeti Anambra nà mpaghara ala Igbo na njedebe nke taa, nke echi.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484