Gọọmentị Anambra Eguzobela Òtù Pụrụ Iche Maka Nsogbu Ókè Ala Agụleri Na Ụmụeri

Jan 20, 2021 - 16:37
Jan 21, 2021 - 06:12
 0
Gọọmentị Anambra Eguzobela Òtù Pụrụ Iche Maka Nsogbu Ókè Ala Agụleri Na Ụmụeri

By Izunna Okafor

Gọọmentị steeti Anambra eguzobela òtù pụrụ iche mmadụ iri na ise nọ na ya, maka ilebà anya na nsogbu ahụ pụrụ iche na-adapụta n'etiti obodo Aguleri na Umueri, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Anambra East' nke steeti ahụ.

Òtù a pụrụ iche bụ nke e guzobere site n'aka Gọvanọ Willie Obianọ, ma bụrụkwa nke e guzobere n'obi gọọmentị dị n'Ọka (Awka).

Ya bụ òtù nwere Maazị Ben Chiobi dịka onyeisioche ya, ma nwee Oriakụ Ndidi Onuigbo dịka odeakwụkwọ ya.

Ndị ọzọ so na ya bụ òtù gụnyere Kọmishọna Ikpe Nkwụmọtọ na steeti ahụ, bụ Dọkịta Uju Nworgu; Kọmishọna na-ahụ maka ala, bụ Maazị Bonaventure Enemali; onyeisioche 'Anambra State Physical Planning Board (ANSPPB), bụ Ọkaiwu Chike Mmadụekwe; onyeisi ọrụ nchekwa nye Gọvanọ Obianọ, bụ Maazị Chinedu Aniagboso; Ọkà nnyocha ala na steeti ahụ lagoro ezumike nka, bụ Maazị Ifeanyi Ajoku; eze ọdịnala Aguleri, bụ Igwe Michael Idigo; eze ọdịnala Umueri, bụ Igwe Ben Emeka.

Mmadụ ise ndị ọzọ bụ onyeisioche nchere oge n'okpuru ọchịchị 'Anambra East', bụ Maazị Obi Nweke; onyeisi ọchịchị obodo Aguleri, bụ Maazị Hipo Onwuegbuke; onyeisi ọchịchị obodo Ụmụeri, bụ Maazị Sunday Udearọ; onyeisi ndị ntorobịa Agụleri, bụ Nnamdi Adimora-Ikeli; onyeisi ndị ntorobịa Umuleri, bụ Maazị Abraham Uberu.

Ọrụ chere ndị òtù ahụ n'ihu gụnyèrè  ịchọpụta ihe kpatara nsogbu ahụ na-adapụta n'etiti obodo abụọ ahụ, ọkachasị nke dapụtara ụbọchị Satọdee abalị iri na isii nke ọnwa; ịkpọ ma gbaa ezinụlọ nwegasị ala ahụ a na-azọ azọ ajụjụ ọnụ, ịkpa oke ala n'etiti obodo abụọ ahụ, ka onwe ọbụla weere mara ebe nke ha bidoro na ebe o jedobere, ya na inye ntụziaka na ịtụpụta atụmatụ kacha mma a ga-agbasò wee weta nsogbu ahụ n'isi njedobe.

E nyekwara ndị òtù a izuụka atọ iji wee chịkọta ọrụ ha, nye nchọpụta ha, ma mekwa ka udo tọrọ atọ dị n'etiti obodo abụọ ahụ nàkwa mpaghara ebe ahụ.


 
N'okwu ya oge ọ na-eguzobe ndị òtù ahụ, Gọvanọ Obianọ, onye ọ bụ osote ya bụ Dọkịta Nkem Okeke nọchitere anya ya gwàra ndị ahụ ka ha were ezi ọgụgụ isi ha nwere dịka ọkaibè na ndị ma nke ekwe na-akụ wee rụọ ọrụ ahụ a hanyere ha n'aka nke ọma, weta mpụtara na nchọpụta ha, ma weghàchitekwa udo tọrọ àtọ n'ebe ahụ ya bụ nsogbu na-adapụta, n'oge adịghị anya.

N'okwu ya n'aha ndị òtù ya, onyeisioche òtù ahụ, bụ 'Air Vice Marshall' Ben Chiobi lagoro ezumike nka nyère gọọmenti na ndị Anambra olileanya na ha agaghị agharịpụ n'ịrụ ọrụ ahụ a hanyere ha n'aka. O kwuru na ndị so n'otu ahụ bụcha ndị ñụjuru mmiri ara afọ na ndị ma nke ekwe na-akụ, tinyekwuoro na ndị eze ọdịnala, ndị isi ọchịchị obodo na ndị ndu ndị ntorobịa n'obodo abụọ ahụ na-enwe sogbu so n'òtù ahụ, ma kwuo na nke ahụ ga-enyere ha aka na n'ụzọ pụrụ iche ime ka ha rụọ ọrụ ha nke ọma, etu o kwesiri, n'ụzọ dị mfe, na oge a tụrụ anya.

Ọ kpọkuzịrị ma dụọ ndị obodo abụọ ahụ ọdụ ka ha gbaso udo, ma nyere òtù ahụ na gọọmenti aka iwetà udo tọrọ àtọ n'obodo ahụ, maka na o nweghịkwanụ ihe e ji nsogbu na ọgbaaghara eme.
 
Ndị eze ọdịnala obodo abụọ ahụ kelere gọọmenti maka iguzobe òtù ahụ iji gbochie ya bụ nsogbu na-adapụtakarị n'etiti obodo abụọ ahụ kemgbe ọtụtụ ahọ, ọbụladị dịka ha kpọkuru ndị obodo ha dị iche iche ka ha tinye mmà ha n'ọbọ, ma gbasoo ụzọ udo wee kpezie, n'ihi na o nweghị ezi ihe ọbụla ọgbaghara na-eweta, karịa ịdọgachi mmepe obodo azụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.