N'Anambra, Nnukwu Ụlọelu Ọzọ Adaala n'Ime Abalị, Mebisie Ihe

Jun 6, 2021 - 18:39
Jun 6, 2021 - 20:17
 0
N'Anambra, Nnukwu Ụlọelu Ọzọ Adaala n'Ime Abalị, Mebisie Ihe

Izunna Okafor dere akụkọ a

Nnukwu ihe akụkọ ọgbọgba ama mèrè na nsonso a, dịka mmadụ isii gbanahịrị ọnwụ ike ma jiri ndụ ha pụta oge otu nnukwu ụlọelu ọzọ dara na steeti Anambra.

Ya bụ ụlọ bụ nke dara n'Amawbia dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Awka South', ma bụrụkwa nke e kwuru na ọ bụ otu onye ọrụ Injinia nwe ya.

Dịka akụkọ siri kọọ, ụlọ elu ahụ nwere òkpùkpù abụọ dàrà n'ihe dịka elekere iri na otu nke abalị, metụta otu ụlọ ebe obibi ọzọ na ụlọ ahịa dị nso n'ebe ahụ, ma mebisiekwa ọtụtụ ihe, ọkachasị ngwaahịa juru n'ụlọ ahịa ahụ, bụ nke gburu ego ruru nde kwùrú nde naịra.

N'ihi na ọ bụ n'abalị ka ya bụ ụlọ dara, o metụtara mmadụ isii, bụ otu ezinụlọ ndị nọ n'ime ya oge ọ dara, nke mmadụ anọ n'ime ha nwètara obere mmerụahụ, ebe mmadụ abụọ ndị ọzọ nwetara nnukwu mmerụahụ ma bụrụkwa ndị e buru gaa ụlọọgwụ maka inye ha ọgwụgwọ.

N'okwu ya banyere ihe ọdachi ahụ, onyeisi ezinụlọ ndị ahụ ya bụ ụlọ dagidere, bụ Maazị Augustine Ikeji, kèlèrè Chineke maka etu o siri zọpụta ha niile, nke na o nweghị onye ọbụla n'ime ha nwụrụ n'ihe mberede ahụ, ọkachasị obere nwa ha gbara naanị ahọ abụọ, bụ onye nọkwa n'ime ụlọ ahụ oge ọ dara, ma bụrụkwa onye ihe si n'ụlọ ahụ dagidere ma kpuchido oge ahụ ya bụ ụlọ dara.

N'okwu nke ya, nwunye onye nwe ụlọ ebe ahụ ụlọ nke dara ada metụtara, bụ Oriakụ Amaka Okonkwo mèrè ka a mara na ọ bụ n'ihi iji akụrụngwa adịgboloja wee rụọ ụlọ na ịrụ ụlọ n'usoro ekwesighị ekwesi mere ya bụ ụlọ jiri wee daa. O kọwakwara na ụlọ dara etu ahụ gosìrì na o tèéla o jiri nyebe ụñàrà maka ọdịda ya, mana o nweghị onye tinyere uche na ya.

Na ntụnye nke ya, onye nwe ụlọ ahịa ahụ ya bụ ụlọ dagidere, bụ Maazị Sunday Nwaeze mere ka a mara na ihe ahụ bụụrụ ya nnukwu ihe ọdachi na ihe ndọghachiazụ, ma rịọ gọọmenti na ndị ọzọ ọrụ obiebere na-amasị ka ha gbatara ya ọsọ enyemaka, n'ihi na ya bụ ụlọ ọdịda wetaara ya mbibi ngwaahịa n'ụzọ dị ukwuu.

Oge ọ gara n'ebe ahụ ya bụ ihe nọrọ wee mee, onyeisi ụlọọrụ 'Awka Capital Territory Development Authority (ACTDA)', bụ Maazị Amaechi Okwuosa kọwàrà ya dịka nnukwu ihe ọdachi, ma kwuo na a rụrụ ụlọ ahụ n'enweteghị nkwàdo zuru òkè site n'aka ụlọọrụ 'Anambra State Urban Developmenta Board' (ASUDEB).

Ọ nọkwazịrị ebe ahụ wee kwuwaa na gọọmenti steeti ahụ ewègharalá àlà ebe ahụ a rụrụ ụlọ ahụ dara ada ka ọ bụrụzie nke gọọmenti, ma kọwaa na nke ahụ bụ nke gọọmenti na-eme ebe ọbụla ụlọ dàrà na steeti ahụ, dịka ọ dị n'ụfọdụ akwụkwọ iwu dị iche iche gbasaara ụlọ ọdịda na steeti ahụ. O kwuru na ebumnobi nke ahụ bụ iji mee ka ndị ọzọ mụrụ akọ ma na-enweta nkwàdo kwesiri ekwesi tupu ha arụba ụlọ, ma jirikwazie ezigbo akụrụngwa zuru òkè wee na-arụ ya.

N'ihi na a sị na ọ na-abụ onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ; a nọkọkwazịrị n'ebe ahụ wee jiri eriri kechie ma gbachibido ala ebe ahụ ya bụ ụlọ dara, site n'aka ụlọọrụ ACTDA, iji gosi na ọ bụrụla nke gọọmenti n'eziokwu.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484