Ndị Germany Awụchaala Anambra Ịchọ Ohere Mwunye Akụnụba

May 29, 2022 - 13:27
 0
Ndị Germany Awụchaala Anambra Ịchọ Ohere Mwunye Akụnụba


Izunna Okafor dere akụkọ a

Onye nnọchianya mba Germany n'ala Nigeria, bụ Dọkịnta Bernd von Münchow-Pohl na ụfọdụ ndị ọzọ sitere mba ahụ awụchaala na steeti Anambra maka ịchọ ụzọ mmekọrịta na njikọaka ha na gọọmenti steeti ahụ, dịka o siri metụta ngalaba ebe ha nwere ike itinye akụnụba.

Ndị ahụ, nke ọ bụ Dọkịnta Münchow-Pohl duru ha wee bịa, bụ ndị a nabatakwa ka ha wụchara n steeti ahụ site n'aka Gọvanọ steeti ahụ, bụ Ọkammụta Chukwuụa Soludo, onye ọ bụ Kọmishọna stteti ahụ na-ahụ maka omenala, ime obi ụtọ na njem nlegharịanya, bụ Maazị Don Onyenji nọchitèrè anya ya.

Ka ha na-enwe mkparịtaụka banyere njem ahụ ha bịara nà ebumnobi ha, Gọvanọ Soludo gwara ndị ahụ na e nwegasịrị ọtụtụ ngabala dị icheiche na ohere ọma jupụtara na steeri ahụ, ebe ndị oji ego achụ ego nwere ike itinye ego ha, ma nwekwa ọtụtụ ohere njikọaka dị icheiche jupụtara na gọọmenti ya.

O kwuru na ọ bụ etu ahụ ndị ahụ siri bịa ka ọtụtụ ụlọọrụ na ndị ọzọ sitere mba dị icheiche sikwà abịa kemgbe ọchịchị ya malitere ọrụ, ịchọpụta ohere dị icheiche ebe ha nwere ike itinye ego nàkwà ụzọ dị icheiche ha na gọọmenti pụrụ isi jikọọ aka ọnụ.

Na nzaghachi ya oge ha kpachara nkàtá ma tụchaa aro banyere ihe ha bịara, onye du ndị ahụ wee bịa ya bụ njem, bụ Dọkịnta Münchow-Pohl kwupụtara obi ụtọ ya maka ịbịa steeti Anambra nàkwà ịhụ ohere dị icheiche jupụtara na ya, bụkwa ịke ha nwere ike itinye akụnụba na ya.

O mere ka a mara na ọbịbịa ahụ ha bịara bụ maka na ọ hụtara Anambra dịka steeti dị ezi mma ma nwekwa ezi ọnọdụ maka azụmahịa na mwunye akụnụba, tinyere ọtụtụ ohere ndị ọzọ jupụtara na ya.

Ndị òtù ahụ mechàzìèrè gaa kpọtụrụkwa eze ọdịnala Onitsha, bụ Igwe Nnaemeka Achebe n'obi ya, bụkwa ebe ọ nabatara ha nke ọma ma kọwakwara ha ọtụtụ ohere na ebe dị icheiche ha nwere ike itinye akụnụba na steeti ahụ. Ọ nọkwara n'ebe ahụ kwe ha nkwà nkwàdo na ngọzị ya.

Igwe Achebe mechàkwàzièrè nye ndị ahụ onyinye pụrụ iche, site n'inye ha akwụkwọ o dere, ma gọziekwa njem ha.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484