N'Anambra, Nri Emeela Emume Ịgụ Arọ

Feb 27, 2022 - 17:57
 0
N'Anambra, Nri Emeela Emume Ịgụ Arọ

Izunna Okafor dere akụkọ a


Omenala bụ nnọọ njirimara ndị ma bụrụkwa ebube e ji ama mbà n'ọha obodo. Nke a bụ nke pụtara ihè n'anya ụwa na nsonso a dịka imirikiti mmadụ zukọrọ n'óké obi ndị Igbo, bụ obodo Nrị nke dị n'okpuruọchịchị ime obodo Anaọcha nke steeti Anambra wee merube mmemme Ịgụ Arọ Ndị Igbo, bụ nke malitere kemgbe ọtụtụ ahọ gara aga.
  
Ya bụ emule Ịgụ Arọ, nke ọtụtụ ndị mmadụ sitere ebe dị icheiche sonyere na ya, bụ àgbà nke otu puku na iri abụọ na atọ (1023) ya, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n'obi Eze Tabansi Udene, bụ onye nọ n'isi nlekọta ihe ọkpụ nri.

N'okwu ya n'ebe ahụ oge ọ na-eme omenala Ịgụ Arọ ahụ kpọnkwem, onyeisioche Umuọkpala Adama, Dọkịta Emma Enemuo kọwàrà ya bụ mmemme dịka oke mmemme pụrụ iche n'ala Igbo, ya na mmemme a na-anọ na ya wee kwuwaa mmalite oge ọrụ Igbo n'ala Igbo, kwuo ka ọrụ ugbo ga-esi gaa, ma kpee ekpere, gọkwa ọfọ dị icheiche maka oge ọrụ ubgo ahụ, ya na udo na ọganihu obodo Nri na ala Igbo niile.

O nyere nkọwa banyere emume Ịgụ Arọ n'ala Igbo, kọwaa uru ọ bara, mpụtara ya, etu e si eme ya, nakwa ihe dị icheiche a na-emegasị na ya, ma mekwa ka a mara na ọ bụ ihe dịbara gboo n'ala Igbo ma bụrụkwa nke si n'aka ọtụtụ ọgbọ gara aga. 

Na mbụ n'okwu nke ha oge ha na-agọ ọjị ma na-atụ nzu na mmemme ahụ, onye ji ọkwa Ọkwụdolụ Eze Nri, bụ Maazị Maduka Muojuluaru, na onyeisioche Orunzenino Nri, bụ Ichie Mike Igidigi kelere Chineke ma nchekwa ya na ngọzị ya n'isi obodo Nri na ụmụafọ Igbo ma kelekwa Ya maka ahọ ọrụ ugbo na owuwe ihe ubi gara aga.

Ha kpekwazịrị ka ahọ nke a makarịa, gaz siriri-werere ma jupụtakwa n'ụba karịa ahọ nke gara aga.

Na ntụnye nke ha n'otu n'otu, Onyeisi ọchịchị ‘Nri Progress Union (NPU)’, bụ Maazị Kelvin Obiegbunam, ya na ụfọdụ ndị ọzọ ihe gbasaara omenala na-amasị, nke gụnyere Mazz Eugene Obi-Okoye na Maazị Nnoli Nwako kọwara mmemme ahụ dịka nke magburu onwe ya, ma mee ka a mara na ụdị ọmarịcha mmemme dị etu ahụ dị oke mkpà n'ihi na ọ ga-enye aka n'ụzọ pụrụ iche n'ime ka ụmụ na-eto eto mara maka ihe dị iche iche ha kwesiri ịma banyere omenala Igbo.

Ha kọwakwara ya bụ emume dịka nnukwu mmemme na-akpọkọlọta ụmụafọ Nri na Ndị Igbo ọnụ iji gosi na ha bụ otu, ma tinyekwa olu ha wee dụọ ndị Igbọ ọdụ ka ha na-echekwaba olenala na njirimara ha, ka ha we ghara ifunàhị ha.

Nnukwu mmemme ahụ wééré ọnọdụ na nsonso a dọtara ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu na steeti Anambra, ndị na-egwu okwe ndọrọndọrọ ọchịchị, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ ihe gbasaara omenala Igbo na-amasị.

A nọrọ na ya bụ mmemme mee ihe ngosi ma gbakwa egwu ọdịnala dị icheiche, rikwa erimeri dị icheiche e jiri mara ndị Igbo.

A nọkwara na mmemme ahụ wee gbapee oge ahọ ọrụ n'ala Igbo mak ahọ a bụ 2022, nọrọ ebe ahụ kesàárá ndị mmadụ ji ha ga-akọ àkọ n'ubi, ma nọrọkwa na ya bụ oke mmemme wee wepute ma kpughee Agụmagụ Ahọ Ndị Igbo (Igbo calendar) ọhụrụ, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ e mere ebe ahụ.

Ọ dị mkpa icheta na ịgụ arọ Igbo nwere ọnwa iri na atọ n'ahọ, izuụka asaa n'ọnwa, na ụbọchị anọ n'izuụka, nke bụ ahịa anọ dị n'izu (Eke, Orie, Afọr, and Nkwọ), tinyere otu mkpụrụ ụbọchị na-amapụta n'ọnwa ikpeazụ nke ngwụcha ahọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484