Obianọ Agbapeela Ụlọ Ezumeezu Anambra, Nye Ọtụtụ Onyinye Nkwanyeugwu

Mar 10, 2022 - 23:45
 0
Obianọ Agbapeela Ụlọ Ezumeezu Anambra, Nye Ọtụtụ Onyinye Nkwanyeugwu
Aka na-achị steeti Anambra, Gọvanọ Willie Obianọ (nke mbụ n'aka ekpe), Oriakụ Ebelechukwu Obianọ (nke abụọ n'aka ekpe), na ụfọdụ ndị ọzọ sonyere nà mmemme ahụ


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ gbapere ọmarịcha ụlọ ezumeezu mba ụwa ahụ ọ rụrụ na steeti Anambra, bụ ‘International Conference Centre (ICC)’.

Ya bụ mmemme wééré ọnọdụ n'Awka bụ nke dọtara ọtụtụ ndị dị icheiche e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ na mpụga ya, ma bụrụkwa nke Gọvanọ Obianọ nọrọ na ya wee nye ọtụtụ ụmụafọ steeti ahụ onyinye nkwanyeùgwù, n'ihi ntụnye dị icheiche ha megoro n'ịkwalite ùgwù, udo, ọganihu na ọnọdụ mmepe steeti ahụ.

A nọkwara na ya bụ mmemme wee kpùghee akwụkwọ e dere ọhụ banyere ndụ Gọvanọ Obianọ, ya na akwụkwọ ọzọ Maazị Ike Chioke dere banyere ọchịchị Gọvanọ Obianọ n'Anambra, bụ nke ọ kpọrọ ‘Akpokuedike, Duty Call in Anambra’.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Gọvanọ Willie Obianọ, onye kpọpụtasịrị ụfọdụ ihe gbara ọkpụrụkpụ ọchịchị ya mepụtara, ma kelee ndị dị icheiche nyere aka ime ka ọchịchị ya gaa nke ọma. 

O nyere nkọwa banyere ụlọ ezumeezu ahụ na ụfọdụ akụrụngwa e jiri rụọ ya, bụkwa nke ga-abàta puku kwuru puku mmadụ otu oge, ma mekwa ka a mara ọtụtụ uru dị icheiche ya bụ ogige ga-abara steeti Anambra na ụmụafọ ya. 

Ụfọdụ ndị dị icheiche Obianọ nyere onyinye nkwanyeugwu na mmemme ahụ gụnyere eze ọdịnala Onitsha, bụ Igwe Nnaemeka Achebe; odeakwụkwọ izugbe Commonwealth n'oge mbụ, bụ Chiifu Emeka Anyaọkụ; onye Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu na repọbịlịk nke mbụ, bụ Chiifu Mbazulike Amaechi; ụfọdụ ndị gọvanọ na osote chịbụrụ steeti ahụ oge mbụ, nke gụnyere Maazị Peter Obi, Dọkịta Chris Ngige, Virgy Etiaba, Maazị Emeka Sibeudu, Chiifu Emeka Offor, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

E nyekwara ụfọdụ ụmụafọ steeti ahụ lagoro mmụọ onyinye nkwanyeugwu, nke gụnyere Ọkammụta Dora Akunyili, Dọkịta Chuba Okadigbo, Dọkịta Nnamdi Azikiwe, Chiifu Emeka Ojukwu na ọtụtụ ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484