Ọba Akwụkwọ Anambra Emerùbela Ụbọchị Ụmụnwaanyị na Mba Ụwa

Mar 9, 2022 - 22:19
 0
Ọba Akwụkwọ Anambra Emerùbela Ụbọchị Ụmụnwaanyị na Mba Ụwa


Izunna Okafor dere akụkọ a

A dụọla ụmụnwaanyị ọdụ ka ha bụrụ ndị kwụdosiri ike, ma na-azụlitekwa ụmụ ha nke ọma, dịka otu n'ime ụzọ a pụrụ isi dozie obodo, ma belata mpụ na arụrụala n'obodo.

Òkù a bụ nke a kpọrọ site n'ọnụ onyeisi ọba akwụkwọ steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkechi Udeze n'okwu ya na mmemme imerube Ụbọchị Ụmụnwaanyị Na Mba Ụwa, bụ 'International Women's Day' nke ahọ 2022, bụkwa nke ọba akwụkwọ ahụ chịkọbara n'ahịa Orie Ukpo dị n'Ukpo, n'okpuru ọchịchị Dunukọfịa nke steeti Anambra.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Dọkịta Udeze chètààrà ụmụnwaanyị sonyere na mmemme ahụ na oge agaala mgbe a na-ahụta ịzụ̀ nwaanyị n'akwụkwọ dịka imefù ego, ọbụladị dịka ọ kọwàrà ụmụnwaanyị dịka ndị nwere ọtụtụ ọrụ n'ịkwàlite mmepe obodo. 

Ọ kpọpụtasịrị Ngozi Okonjo-Iweala, Chimamanda Adịchie, na ọtụtụ ụmụnwaanyị ndị ọzọ dịka ụfọdụ ndị gosipụtagoro na mmadụ ịbụ nwaanyị abụghị ihe mgbochi nyegara nwaanyị ọbụla gụrụ akwụkwọ maọbụ nwaanyị pụrụ iche ịbụ ihe o kwesiri ịbụ ma ruo ogoogo ọ chọrọ iru n'ụwa.

Ọ dụrụ ụmụnwaanyị ahụ ọdụ ka ha guzoro, màá ihe ọbụla na-echere ha aka mgba aka, karịa ịdà ụrụhụ, ịnọ otu ebe, ịdabere na mmadụ, maọbụ ikoròpù n'ihi etu ọnọdụ siri dịrị ha.

Na mbụ n'okwu mmalite ya, Oriakụ Cordelia Obalum kèlèrè ụmụnwaanyị ahụ maka ịpụtà n'ìgwè wee sonye na mmemme ahụ, ma dụọ ha ọdụ ka ha gba mbọ na-esonyesi ike n'ụdị ọmarịcha mmemme dị etu ahụ, ebe ha ga-amụta ihe ga-abara ha uru ma nyekwara ha aka na ndụ, karịa ịdị na-aga naanị ebe ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-akpọ oku, maọbụ ebe a ga-eke ha naanị ego.

Na ntụnye nke ya, otu nwaafọ obodo Ukpo ma bụrụkwa nwaanyị mbụ bụrụ Ọkammụta na ngalaba ihe ọmụmụ ‘Mass Communication’ na mpaghara ọ̀dị̀dà anyanwụ Africa, bụ Ọkammụta Stella Okunna gbàrà akaebe na e nwegasịrị ụfọdụ omenala na-akpachapụ ụmụnwaanyị n'akụkụ maọbụ mee ka ha ghara ikwenyesi ike n'onwe ha; mana ọ dụrụ ụmụnwaanyị ahụ ọdụ ka ha leghàrá ihe iche aka mgba dị etu ahụ anya, ma gbasie mbọ ike iji sò tụnye ụtụ nke ha na mmepe obodo.

Ka ọ na-akatọ̀ akparamagwa ụfọdụ ụmụnwoke ndị na-ahụta ụmụnwaanyị maọbụ ọganihu ụmụnwaanyị dịka ihe egwu nyéré ha bụ nwoke; Ọkammụta Ọkụnna chetààrà ụmụnwoke dị etu ahụ na ihe ụmụnwaanyị anaghị azọ ka ha na nwoke hara nhatanha, kama na ọ bụ ka ha sokwa n'ihe a na-eme. O kwukwazịrị na ụmụnwaanyị ga-aga n'ihu ịgbasi mbọ ike ka ha wee bụrụ ndị ọnụ na-eru n'okwu n'obodo ma na-atụnyekwa ụtụ na mmepe obodo, maka na nwaanyị bụ ihe.

Na mbụ na nkụzi ya, onye ọbịa nyere nkụzi na mmemme ahụ, bụ Ọkammụta Nkechinyere Nwokoye kọ̀wàrà mpụtàrà Ụbọchị Ụmụnwaanyị na Mba Ụwa, bụ nke a na-emerùbe n'abalị asatọ nke ọnwa Maachị ahọ ọbụla, ma mee ka a mara na oge agaala mgbe a na-akpazuga ụmụnwaanyị n'akụkụ dịka ndị enweghị ihe ha bụ. Ọ gwara ụmụnwaanyị ahụ ka ha kwenyesie ike n'onwe ha, chọpụta ma jiri amamihe, akaraka na ọnatarachi Chukwu jiri gọzie ha wee rụsie ọrụ ike iji kwàdó ezinụlọ ha ma tụnye ụtụ na mmepe obodo, karịa ịbụ ndị na-adabere na mma maọbụ na-ahụta onwe ha dịka ndị enweghị ọnụokwu.

Ka ọ na-atụwa isiokwu mmemme ahụ nke ahọ a, bụ “Nhatanha Oke na Nwunye Taa, Nke Na-arụtụ Aka Maka Echi” (Gender Equality Today for Sustainable Tommorow), Ọkammụta Nwokoye katọrọ etu ndị mmadụ si aghọtie ya oge ọbụla e kwuru ‘nhatanha oke na nwunye’, ọbụladị dịka ọ dụrụ ụmụnwaanyị ahụ ọdụ ka ha bụrụ ndị na-achọ ma na-enwe mmasị ịnọ n'ogoogo dị elu, na-akwalite ma na-egosipụta uru ha bara n'obodo, maka ọnọdụ kawanye mma echi.

N'ozi ekele ya, otu onye n'ime ndị sonyere na mmemme ahụ, bụ Oriakụ Evelyn Okoye kèlèrè Ọba Akwụkwọ Anambra maka imerùbe mmemme ahụ n'obodo ha, bụ nke na-egosi na ihe banyere ya bụ obodo na-emetụta ọba akwụkwọ ahụ n'obi, ma bụrụkwa nke na-egosi na ya bụ ọba akwụkwọ bụ ọba akwụkwọ ọhaneze na nke obodo niile n'eziokwu. Ọ rịọkwazịrị ka e jigide ma kwàlite ezi mmekọrịta ahụ dịgoro n'etiti obodo ahụ na ọba akwụkwọ ahụ, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ụmụnwaanyị ibe ya ka ha tinye ihe niile a kụziiri ha ebe ahụ n'ọrụ, maka ọdịmma ha, ọganihu na mmepe obodo.

Mmemme Ụbọchị Ụmụnwaanyị na Mba Ụwa bụ nke a malitere mebe n'ahọ 1911, ma bụrụkwa mmemme e si na ya wee na-emerùbe ma na-akpọ òkù maka ịkwàlite ọdịmma na ikike dịịrị ụmụnwaanyị, na-akatọkwa megide ụfọdụ a na-emegidz ụmụnwaanyị. Mmemme ncheta ụbọchị ụmụnwaanyị na-ewere ọnọdụ n'abalị asatọ nke ọnwa Maachị ahọ ọbụla.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484