Na US, Ụmụakwụkwọ Emeela Ngagharị Iwe Maka Mwakpo Ụlọakwụkwọ

Jun 7, 2022 - 21:38
 0
Na US, Ụmụakwụkwọ Emeela Ngagharị Iwe Maka Mwakpo Ụlọakwụkwọ

Chinwendu Uzoatu dere akụkọ a

 Ụmụakwụkwọ na-agụ n'ụlọakwụkwụ ọhaneze, na mba United States of America (USA), emeela ngagharị iwe megide agha egbe nke a na-ebu n'ụlọakwụkwọ na mba ahụ.
 Ha mere nke ahụ iji gosị mwute ha, ma katọ̀ọ́ ogbugbu e gburu ụfọdụ ụmụakwụkwọ na Texas, bụ ebe a gbagburu ụmụakwụkwọ prima dị iri na iteghete na ndị okenye abụọ, na nsonso a. Ọnọdụ ịwakpo ụlọakwukwọ bụ ihe a na-ahụtakarịzi na US.
  Ụmụakwụkwọ ahụ bagidéré na ngagharị iwe ahụ ka e kwuru na ha nuputara n'igwe n'ụlọakwụkwọ ha dị icheiche, site na steeti dịgasị na mba ahụ, wee gagharịa ma katọ̀ọ́ otu e si eji egbe awakpo ma na-agbagbu ụmụakwụkwọ. Ha sitere n'ụlọakwụkwọ ha gaa n'ama egwuregwu bọọlụ, ebe ha nọrọ wee dụ̀ọ́ ya bụ ọdụ.
 Ihe onyoonyoo gosipụtara ụmụakwụkwọ ka ha nọ na ngagharị ahụ na mpaghara dịgasị na mba ahụ, dịka Rhode Island, New York, Michigan, Missouri, Califonia wdg.
 Otu nwaakwụkwọ nke South Burlington High School aha ya bụ Parker Banas sị na ya bụ ihe gbawara ya obi, na o nyeghị ya ọnụ okwu.
 Ọ dị ncheta na mwakpo kachasị dàá ụda na mba US bụ nke mere afọ iri gara aga, na Burlington, Sandy Hook Elementary School, bụ ebe a gbagburu ụmụakwụkwọ iri abụọ na ndị okenye isii.
 Ka ọ dị ugbua, nchọcha na-egosipụta na e jirila egbe wakpoo ụlọakwụkwọ iri abụọ na asaa na mba ahụ n'ime afọ a, ma si na nke ahụ na-ala ọtụtụ ndụ n'íyì.
 N'ọnwa Nọvemba afọ gara aga ka otu nwata gbara afọ iri na ise ji egbe wakpo ụlọakwụkwọ, Oxford High School, gbagbuo ụmụakwụkwọ anọ ma merụọ mmadụ asaa ahụ. Ndị uweojii kwuru oge ahụ na egbe ahụ nwata ahụ jiri kpa mkpamkpa ahụ bụ nne na nna ya goteere ya dịka ihe onyinye.
  Ndị haziri ngagharị iwe ahụ bụ òtù ndị ntorọbịa nọ n'isi ya, a kpọrọ ‘Students Demand Action (SDA)’, bụ nke na-akpọsi òkù ike ka e leruo anya ma mezie iwu na-achị mmadụ iji egbe. E hibere otu ahụ ka e gbuchara ụmụakwụkwọ iri na asaa na ndị ọrụ n'ụlọakwụkwọ Florida's Majority Stoneman Douglas High School, n'afọ 2018.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484