Soludo Eguzobela Òtù Ọrụ Ọhụrụ Maka Nchekwa

Apr 8, 2022 - 19:45
 0
Soludo Eguzobela Òtù Ọrụ Ọhụrụ Maka Nchekwa


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọchịchị steeti Anambra nọrọ ụbọchị Wenezdee wee guzobe òtù ọrụ pụrụ iche ga na-ahụ maka eziokwu, ikpe nkwụmọtọ na udo, bụ nke a kpọrọ ‘Truth, Justice and Peace Committee’, dịka otu n'ime agbambọ ya iweta udo tọrọ atọ na steeti ahụ ma lebàkwa anya na nsogbu na ịkpọ ganịganị otu dị icheiche na-eme na steeti ahụ.

Odeakwụkwọ izugbe steeti Anambra, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu bụ ya kwupụtara nguzobe ndị otu a n'obi gọọmenti dị n'Awka, bụkwa ebe ọ nọrọ kọwaa na nke ahụ bụ nke dabara adaba dịka otu n'ime okwu e tinyere ọnụ na nkwekọrịta e nwere na nnukwu ọgbakọ ahụ gọọmenti steeti ahụ chịkọbara n'isi ngwụcha izuụka gara aga, bụ nke a kpọrọ ‘Peace Building and Security Dialogue’.

Otu ahụ bụ nke mmadụ iri na ise nọ na ya, ma bụrụkwa nke onyeisi ụlọọrụ ‘National Human Rights Commission’ n'oge gara aga, bụ Ọkammụta Chidi Odinkalu bụ onyeisioche ya; ebe Oriakụ Bianca Ojukwu bụ odeakwụkwọ ya.

Ndị ọzọ so n'otu ahụ gụnyere Dọkịta Joe Nwaorgu, Dọkịta Udenta Udenta, Dọkịta Uju Agommo, ‘Rev Fr. Monsignor’ Jerome Mmadueke, ‘Reverend Canon’ Okechukwu Obi-Okoye; Maazị Charles Oputa (Charley Boy), Dọkịta John Otu, Maazị Ngozi Odumuko, Nwaada Onyeka Onwenu, Dọkịta Joe Abah, Maazị Chukuwma Okpalaezeukwu, Maazị Sam Egwuatu na Ọkammụta Joseph Ikechebelu.

Oge ọ na-ekwupụta nguzobe òtù ahụ, Ọkammụta Chukwulobelu gụpụtaara ha ihe bụ ọrụ ha, nke o kwuru na ọ gụnyere ileba anya na ịchọpụta ihe na-akpata ịkpọ ganịganị niile a na-enwe na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ malite kemgbe ahọ 1999 wee ruo taa, depụta ndị dị icheiche e gbugoro na nke ahụ, depụta imekpa ahụ na ịtụ nga niile e nwegoro n'ihi nke ahụ, depụta ndị na otu dị icheiche sonyegoro maọbụ megoro ihe a hụrụ anya n'ịkpọ ganịganị na ọgbaaghara ahụ, ọrụ ha, ike ha na ihe ha chọrọ.

O kwukwara na ọrụ ha gụnyere ịchọpụta na ileba anya n'ihe ọbụla dị mkpa nwere ike ibute ọgbaaghara maọbụ nye aka n'iweta ọgbaaghara n'isi njedobe, ya na inye gọọmenti ndụmọdụ n'ihe e kwesiri ime iji weta udo na ọnọdụ nchekwa bụ ịgbà na steeti ahụ na na mpaghara ala Igbo niile, tinyere ọtụtụ ọrụ ndị ọzọ e depụtaara ha ha ga-arụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484