Arọndizuọgụ Emeela Ikeji

May 6, 2022 - 12:12
May 6, 2022 - 12:13
 0
Arọndizuọgụ Emeela Ikeji


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na steeti Imo, dịka obodo Arọndizuọgụ merùbèrè otu emume pụrụ iche e ji mara obodo ahụ, bụ emume Ikeji, nke ahọ 2022.

Ya bụ mmemme bụ nke a na-eme kwà ahọ ọbụla, ma bụrụkwa nke ọtụtụ ụmụafọ obodo ahụ na ndị sitere mpaghara ebe dị icheiche n'ụwa gbaa gburugburu na-esonye na ya.

N'okwu ya banyere mmemme ahụ nke ahọ a, otu onye ndu obodo Ndiakunwata Iheme dị n'okpuruọchịchị ime obodo ‘Ideato North’ nke steeti Imo, ma bụrụkwa onye ihe gbasaara ịkwàlite omenala Igbo na-amasị, bụ Maazị Innocent Ezuma dụrụ ndị eze ọdịnala obodo dị icheiche dị n'ala Igbo odụ ka tute ọmarịcha omenala na ọdịnala ndị Igbo dị icheiche a gbakụtazịrị azụ ugbua, ya nà omenala ndị nke na-anwụzị anwụ taa. O kwuru na nke ahụ ga-enye aka iji kwàlite nchekwaba omenala na ọdịnala dị etu ahụ, ya na ọganihu, ùgwù na nsọpụrụ dịịrị ndị Igbo n'ala Nigeria na n'etiti ha na ndị mba ọzọ.

Ọ dụrụ ndị Igbo n'ụwa gbaa gburugburu ọdụ ka ha gharakwa ikwe ka ọbịbịa nke Sayensị na Teknụzụ (Sience and Technology) maọbụ mmetụta nke agụmakwụkwọ ndị ọcha wetere mezie ka ha gbahapụ omenala na njirimara ha maọbụkwanụ chezọọ ebe ha si.

Dịka ọ na-eme ka a mara na òtù mba ụwa ‘United Nations Educational, Scientific and Cultural Organisation (UNESCO)’ agụpụtala emume Ikeji dịka ótù n'ime emume kacha ewu èwù n'ụwa gbaa gburugburu; Maazị Ezuma, onye e ji ‘Agunechemba n'Arondizuogu’ wee mara, dụkwazịrị gọọmenti ala Nigeria na gọọmenti steeti dị icheiche n'ala Igbo ọdụ, ka ha tinye aka n'ọrụ ịkwàlite, ịkwàdò na ichekwaba omenala Igbo.

Ọ sị: “Onye Igbo ọbụla kwesiri ịgbaso na ichekwaba omenala ya, n'ihi na nke ahụ so n'ihe mere ndị nna nna anyị ha jiri bie ogologo ndụ n'enweghị ụlọọgwụ na ụlọakwụkwọ dị n'oge nke ha.

"Agụmakwụkwọ sayensị na teknụzụ dị mkpa, mana anyị ekwesịghị ikwe ka ha gbuo ihe nketa ọdịnala anyị bara oke uru, nke bụkwa ụzọ ndụ anyị. Nke a bụ n'ihi na ọ bụrụ na e nweghị omenala, a gaghị enwe ọdịnihu.” 

Ezuma kwuru na mmemme omenala Ikeji Arọndizuọgụ bụkwa oge mmanwụ dị icheiche ji aba, ma bụrụkwa mgbe ndị mmadụ ji achụrụ ndị nna nna ha àjà ma na-ekpe ekpere maka owuwe ihe ubi dị ukwuu, dịka a na-abanye n'ahọ ọrụ.

Emume omenala Ikeji Arọndizuọgụ bụ nnukwu mmemme na-ewu ewu nke na-ejikọta obodo na-asụ Igbo na gburugburu ụwa ọnụ. Ọ bụ mmemme iri ji ọhụrụ obodo Arọndizuọgụ.

Ya bụ mmemme malitere kemgbe ihe karịrị narị afọ ise, a na-etokwa ya dị ka otu n'ime mmemme omenala obodo Igbo kacha ukwuu nke nwere ọtụtụ ihe mmụta dị omimi na ihe ngosi jupụtara na ya, ma bụrụkwa mmemme puku kwuru puku mmadụ na-echekwube echekwube kwà ahọ ọbụla n'ụwa gbaa gburugburu.

Mmemme Ikeji bụ nke a na-eme n'ime ọnwa Maachị maọbụ Eprel kwà ahọ ọbụla, ma bụrụkwa nke na-ewere ọnọdụ mkpụrụ ụbọchị anọ, nke ga-adabàrịrị n'ahịa anọ ndị Igbo nwere, nke gụnyere Eke, Orie, Afọ na Nkwọ.

Ya bụ mmemme bụkwa nke na-akpọlata ọtụtụ ụmụafọ obodo Arọndizuọgụ ụlọ, n'ihi na a na-anọ na ya mee ọtụtụ ihe ngosi dị icheiche, tie mmanwụ, gbaa egwu ọdịnala dị icheiche, kpee ekpere, rie ma ñụkwa.

Mmanwụ dị icheiche a na-eti ma e mebe emume Ikeji gụnyèrè: Ogwonma, Mgbadike, Ojiọnụ, Nwagwọcha, Agbọmma, Ajikwu, Akatankpo, Ọzọebune, Nwaburuuja, na ụfọdụ ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484