Kọmishọna Obinabo Agbarụọla Ihu Banyere Ụdị Ọnwụ Osinachi Nwụrụ

Apr 18, 2022 - 23:07
 0
Kọmishọna Obinabo Agbarụọla Ihu Banyere Ụdị Ọnwụ Osinachi Nwụrụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Kemgbe izuụka gara aga ka o siri kpọtụba n'usoro nzikọrịtaozi dị icheiche, bụ ọnwụ otu onye na-eti egwu ụka a mà ámá nke ukwuu, bụ Oriakụ Osinachi Nwachukwu, bụ onye e kwuru na ọ nwụrụ n'ihi nsogbu ezinụlọ, nke gbadoro ụkwụ n'etu di ya siri mekpaa ya ahụ ma mesogide ya ka nwaòkpùrù, wee ruo n'ọnwụ ya.

Nke a bụzịkwa nke gara n'ihu na-adọta ọnụmmiriokwu ọtụtụ ndị mmadụ, ma ndị nọ n'ọkwa ọchịchị n'ogoogo dị icheiche nàkwà ndị e ji okwa ha agba izu na ngalaba dị icheiche.

Ka ọtụtụ ndị na-aga n'ihu na-atụnye ọnụ, ya bụ okwu nọkwazịrị na nsonso a wee dọta ọnụmmiriokwu Kọmishọna na-ahụ maka ihe metụtara ụmụnwaanyị na ọdịmma ọhaneze na steeti Anambra, bụ Oriakụ Ify Obinabo, bụ onye katọ̀rọ̀ ma gbarụọ ihu banyere ụdị ọnwụ nwaanyị ahụ nwụrụ.

Ọ bụ oge ndị òtù jikọtara ụmụnwaanyị bụ ndị ntaakụkọ, a maara dịka ‘Nigerian Association of Women Journalists (NAWOJ), ngalaba steeti Anambra, gàrà kpọtụrụ Kọmishọna Obinabo n'isi ụlọọrụ ya dị n'Awka, ka ọ nọrọ wee kwupụta ka obi dị ya banyere Ọnwụ Osinachi.

Ọ nọrọ ebe ahụ wee katọọ ụdị nsogbu dị icheiche, ọkachasị nsogbu metụtara ụmụnwaanyị; ọbụladị dịka ọ dụrụ ndị nne na nna ọdụ ka ha kwe ka ụmụ ha ndị nwaanyị lụrụ di lọta be nna ha bịa nọrọgodi oge ọbụla alụmdinanwunye ha gbanwezịrị wee bụrụ nke tigbuo, zọgbuo na nke mmegide jupụtara n'ime ya. O kwuru na nke ahụ abụghị ịgba alụkwaghịm, kama na ọ ga-enye aka ime ka ihe dajụlata.

O kwuru na obi adịghị ụmụnwaanyị Anambra mma banyere ụdị ajọ ọnwụ ahụ nwaanyị ahụ nwụrụ, ma dụọ ndị ọbụla na-agabiga maọbụ nwee onye na-agabiga ụdị mmegide na mmekpaahụ ọbụla, k a kwupụta ya, karịa imechi ọnụ ya ruo n'ọnwụ.

O kwezịrị nkwà na ụlọọrụ ya ga-eghe oghe maka onye ọbụla chọrọ wee bịa, ọbụladị dịka o kwezịrị nkwà na ọ ga-ejikwa ụlọọrụ ya ahụ wee kọwaara ụmụnwaanyị ihe dị icheiche ha kwesiri ịma, ọkachasị banyere nsogbu ezinụlọ na ụdị nsogbu ndị ọzọ dị icheiche.

Na mbụ n'okwu ya, onyeisioche ndị òtù NAWOJ na steeti Anambra, bụ Oriakụ Franklyn Onyekachi tụ̀ụ̀rụ̀ Kọmishọna Obinabo mmamma ozi ekele banyere mkpọlite ahụ a kpọlitere ya n'ọkwa dịka Kọmishọna, ma gbakwazie akaebe na ọrụ ya na mgbambọ ya dịka onye mgbasaozi abụghị n'efu.

Dịka ọ na-ekwupụta olileanya ha nwere na ọ ga-arụ ọrụ ya nke ọma, ọ rịọkwazịrị ka e nwee ezi njikọaka n'etiti ha na ụlọọrụ ya, ọkachasị n'ịkwàlite ihe metụtara ọdịmma ụmụnwaanyị.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484