Soludo Ezigala Ámụmà Ego Ọrụ A Hazigharịrị Ahazigharị n'Ụlọ Omeiwu Anambra

May 23, 2022 - 22:10
 0
Soludo Ezigala Ámụmà Ego Ọrụ A Hazigharịrị Ahazigharị n'Ụlọ Omeiwu Anambra

 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Gọvanọ steeti Anambra, bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo ezigala ámụmà ego ọrụ e mezigharịrị emezigharị ewepụtala ndenye ego ruru ijeri naira 170 nke afọ 2022 edegharịrị edegharị n'ihu ụlọ omeiwu steeti Anambra.

Ya bụ amụma ego ọrụ bụ nke mperi dị na ya siri na otu narị ijeri naịra iri anọ na otu na ụma iteghete wee gbagoo na otu narị ijeri naịra na iri asaa.

N'okwu ya oge ọ na-agupụ̀tara ndị omeiwu nkọwa ámụmà ego ọrụ ọhụrụ ahụ, o mere ka a mara na pasentị iri isii na anọ n'ime ego ọrụ ahụ bụ màkà ọrụ mmepe obodo; ma kọwakwa na a hụtara mkpa ọ dị ịhazìgharị̀ ego ọrụ ahụ n'ihi etu ọnọdụ akụnụba nà ọnụ ahịa ihe siri dị ugbua.

Ọ kọ̀wàkwààrà ha ihe ndị ọzọ ha kwesiri ịma banyere ya bụ ámụmà ego ọrụ a hazigharịrị ahazigharị, ma  kwe nkwa na a ga-enwe ezi mmekọrịta n'etiti gọọmenti na ndị ọrụ omeiwu steeti ahụ.

Na ntụnye nke ya, Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti ahụ, bụ Rt. Hon. Uchenna Okafor kwupụtàrà nkwenye ọ nwere nà nhazighari ahụ a hazigharịrị ya bụ ámụmà ego ọrụ bụ màkà ọdịmma ụmụafọ steeti ahụ na mmepe obodo, ya na ime ka ọchịchị steeti ahụ magbuo onwe ya.

O kwere nkwà na ndị omeiwu ahụ ga-eleba anya n'amuma ego ọrụ ahụ nke ọma na etu ọ kwesiri.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484