Karama Akụwasịala Dịka Ihe Mberede Okporo Ụzọ Dapụtara n'Ọnịsha

Jan 20, 2021 - 17:29
Jan 21, 2021 - 18:19
 0
Karama Akụwasịala Dịka Ihe Mberede Okporo Ụzọ Dapụtara n'Ọnịsha

By Izunna Okafor

Ọtụtụ karama mmanya adịghị n'ime ha kụgwòsiri n'Ọnịsha dị na steeti Anambra na nsonso a, dịka otu nnukwu ụgbọala gwongworo e ji ebu mmanya nwèrè ihe mberede okporo ụzọ.

Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n'ozi a kụpụrụ nsonso a site n'aka onye na-ahụ maka mgbasa ozi na ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma n'ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps', FRSC (ngalaba steeti Anambra), bụ Oriakụ Edor Florence.

Dịka o siri kọwaa, ya bụ ihe mberede okporoụzọ bụ nke mere na mpaghara Upper Iweka, ma bụrụkwa nke dapụtara n'etiti ụgbọala atọ, bụ nnukwu ụgbọala gwongworo ahụ e ji ebu mmanya Coca Cola (nwéré akàrà efere WDE 711 YE) na ụgbọala 'RS300 Lexus Jeep' (nwéré akàrà efere ABJ 929 SR) na ụgbọala 'Suzuki Shuttle Bus' (nwéré akàrà efere AWK 161 YZ).

Ndị ọnọmgbeomere na-akọwa na ọ bụ ịgba oke ọsọ kpatara ihe mberede okporoụzọ ahụ, bụ nke dapụtara oge nnukwu ụgbọala ahụ pụnahịrị onye na-anya ya n'aka, wee danyeziere ụgbọala abụọ ndị ọzọ; ọtụtụ karama wee dàá ma laa n'iyì. 

Ndị ọrụ FRSC wụchazịrị n'ebe ahụ ozigbo wee malite ibughasị ihe na ụgbọala ndị ahụ n'ụzọ, iji hụ na e nweghị agbakata akwụrụ n'ebe ahụ.

Kaosiladị, mmadụ ise (nwoke anọ na otu nwaanyị) nọ n'ime ụgbọala atọ ahụ ihe mberede ahụ metụtara enweghị onye ọbụla tụfuru ndụ ya maọbụ nweta ihe mmerụahụ ọbụla.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra, bụ CC Andrew A Kumapayi dọrọ ndị na-anyà ụgbọala aka na ntị megide ịgba oke ọsọ, ma dụọ ha ọdụ ka ha na-akpachapụrụ ụgbọala ha anya ma na-elerukwa ya anya etu o kwesiri, iji hụ na ọ nọ n'ezi ọnọdụ, tupu ha eburu ya banye n'okporoụzọ, iji wee belata ihe mberede okporo ụzọ maọbụ ịla ndụ na ngwongwo ụmụ mmadụ n'iyì.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.