Bishọp Ezeokafor Agbapeela Akụrụngwa Nlekọta Ahụike Ọhụrụ n'Awka

May 8, 2022 - 15:58
 0
Bishọp Ezeokafor Agbapeela Akụrụngwa Nlekọta Ahụike Ọhụrụ n'Awka

Izunna Okafor dere akụkọ a


Bishọp ụka Katọlik na dayọsis Awka bụ Paulinus Ezeokafor akpọọla òkù ka e nwee ezi mmekọrịta na njikọaka n'etiti ụka, gọọmentị, ndị nkịtị, na otu dị icheiche n'ịkwalite mmepe obodo, ọdịmma, ọganihu, na ezi ọnọdụ obibindụ nke mmadụ.

Bishop Ezeokafor kwupụtàrà nke a n'okwu ya mgbe ọ na-agbape ụfọdụ akụrụngwa nlekọta ahụike ọhụrụ na ngalaba dị icheiche a rụzigharị arụzigharị n'ogige ụlọọgwụ ‘Regina Caeli Specialist Hospital’ dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra

Ngalaba ụlọọgwụ ndị ahụ a rụzigharịrị gụnyere ngalaba ‘Dental Clinic’, ngalaba ‘Intensive Care Unit’, ngalaba ‘Private Ward’ na ogige ụlọ ekpere ‘Ahụike Ndịorịa Chapel of Perpetual Adoration’.

Ngalaba ndị ahụ a rụzigharịrị bụ nke e mere site na ngbataọsọ na njikọaka ndị ụka na ụfọdụ òtù mba ụwa dị icheiche

N'okwu ya oge ọ na-agbape ogige ahụ, Bishọp Ezeokafor chetara na kemgbe ọtụtụ afọ, ụka gara n'ihu na-atụnye ụtụ pụrụ iche iji kwàdó mbọ dị icheiche gọọmenti na-agba n'ịkwàlite ihe dị icheiche e ji enyere ndụ aka, ọkachasị ihe metụtara ngalaba ahụike, n'ihi oke uru ezi ọnọdụ ahụike dị ná ndụ mmadụ nà ná mmepe maọbụ ọganihu nke obodo.

Kaosiladị, o kwụzịrị na o kwesịghị ka a hapụrụ naanị gọọmenti maọbụ ndị ụka ọrụ dị etu ahụ, n'ihi na otu onye anaghị achụ ngwere mgbahigeaja, tinyekwuoro na ọ na-abụ a gbakọọ aka ọnụ buo ozu enyi, ọ dị mfe.

Dịka ọ na-ekele ndị dị icheiche nyere aka n'ọrụ ịrụzigharị ngalaba ndị ahụ, ya bụ Bishọp kwùrù na ụka na-agawanye n'ihu n'ịkwàdò na n'ịkwalite ụlọọgwụ ahụ iji gboo mkpa ahụike nke ndị mmadụ. Ọ mekwara ka a mara na gburugburu ebe obibi dị mma na-enye aka n'ịkwado ọgwụgwọ ndị ọrịa, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ndị ọzọ bụ ndị aka ji akụ, na òtù dị icheiche ka ha tinye aka na ya bụ ọrụ, n'ụdị maọbụ ụzọ ọbụla ha nwere ike isi nye aka n'ịkwàdò ihe a na-eme.


N'okwu nke ya onyeisi ụlọọgwụ ahụ, bụ Fada Innocent Affusim kpọpụ̀tàsị̀rị̀ aha ụfọdụ ndị ụkọchukwu dayọsis ahụ nyere aka wee dọta ndị kwadoro ya bụ ọrụ site na mba ofesi, nke gụnyere Fada Godwin Okeatu bụ onye na-eje ozi na Switzerland ugbua, na Fada Charles Ogbunabara bụ onye dọtara enyemaka site n'Austria, ma kwuo na e nwògharịala ụlọọgwụ ahụ ka ọ kwụrụ n'egwu ma guzosie ike iji gboo ma mkpa ahụike na mkpa ime mmụọ nke mmadụ.

Fada Affusim kwuru na nkwàdó na ezi njikwa akụrụngwa ụlọ ahụike dịgasị n'ala Nigeria nke ọma ga-enye aka ibèlàtà etu ndị mmadụ si agbaga mba ofesi maka nlekọta ahụike ha oge ọbụla ha nwere nsogbu dị ańáā.

Ya bụ mmemme ịgbape akụrụngwa ahụ bụ nke dọtara nsonye ọtụtụ ndị ọrụ ụka dị icheiche na-eje ozi na dayọsis ahụ, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ bịara iji anya ha hụ ka ya bụ ihe siri gaa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484