Ndị Igbo Bi n'Ekiti Emeela Emume Ụbọchị Omenala Igbo

May 30, 2022 - 22:12
May 31, 2022 - 00:45
 0
Ndị Igbo Bi n'Ekiti Emeela Emume Ụbọchị Omenala Igbo

Izunna Okafor na Chinwendu Uzoatu

 Ndị Igbo bụ agbụrụ anaghị ezo ezo ebe ọbụla ha hụrụ onwe ha. Ha ejighị omenala na njirimara ha egwu egwu. N'ihi nke a, ndị òtù Ọhanaeze Ndigbo, ngalaba steeti Ekiti mere oke mmemme nke dara ụda n'Ado-Ekiti bụ isiobodo steeti ahụ, n'isonyere ndị lgbo bi na steeti ahụ n'ebe ndị ọzọ wee merùbe emume omenala a kpọrọ ‘2022 Igbo Cultural Day’. Emume ahụ dara nnukwu ụda, nke na ndị abụghị ndị Igbo sonyekwara na ya.

 Ụfọdụ ihe dị icheiche e megasịrị na mmemme ahụ gụnyèrè ịchụ nta ego dị otu nde narị naịra na iri ise (150 million) maka ịrụ ụlọ ezumezu ọgbaraọhụrụ, tinyere inyegasị ụfọdụ ndị mmadụ onyinye nkwanyeùgwù dị icheiche, ya na iti mmọnwụ na ime ụfọdụ ihe ngosi ndị ọzọ dị icheiche.
 
Emume ahụ bụ nke ndị lgbo bi na steeti Ekiti na-eme otu ugboro n'ime afọ ise, ma bụrụkwa nke e kwesịrị ime n'abalị anọ nke ọnwa Disemba ahọ gara aga. Kaosiladị, e kwuru na emeghị ya oge ahụ n'ihi na ọ dabara ụbọchị ịtụ akwụkwọ nhọpụta ọkwa okpuruọchịchị ime obodo dị icheiche na steeti ahụ. Ọ bụkwazị n'ihi nke ahụ ka e ji wee bugharịa ya, ma mezie ya n'afọ a.

Emume ahụ, nke a malitere n'afọ 2011 bụ nke a na-eme iji gbaa omenala na njirimara ndị lgbo n'anwụ, ka ụwa hụ n'anya ma kwere na lgbo zuru ka e mee.

 Oke mmemme ahụ kpọkọtara ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba izu, ndị gụnyere Gọvanọ steeti ahụ, Dọkịnta Kayode Fayemi, nke Komishọna na-ahụ maka mmekọrịta na ọrụ pụrụ iche, bụ Hon. Ayodele Jinadu nochitèrè anya ya; Chiifu Alex Ndubisi, bụ Onyeisi Ohanaeze Ndigbo na steeti Ekiti; Ewi nke Ado-Ekiti, Oba Rufus Adejugbe, nke Chiifu Obafemi Ojo Bobajiroro nochitèrè anya ya; tinyere imirikiti ndị ọzọ. 


N'okwu ya nà mmemme ahụ, Onyeisi Ohanaeze Ndigbo na steeti ahụ, bụ Chiifu Alex Ndubisi kèlèrè Gọvanọ Fayemi maka ezi udo na mmekọrịta dị n'etiti ndị steeii ahụ na ndị lgbo bi na ya. O kelekwara onye bụ nnukwu nna nke ụbọchị ahụ, bụ Oba Adejugbe, maka ọrụ ọma ọ na-arụ dịka nna iji hụ na ndị nke ya na ndị lgbo na-ebi n'udo. Ọ gakwara n'ihu kelee ndị eze ọdịnala ndị na-achị obodo ndị ọzọ mejupụtara steeti ahụ, ma kelekwaa ndị ọzọ niile, tinyere kọmitii haziri mmemme ahụ. 
 O toro gọọmenti etiti na nke seeti maka mbọ ha n'ọnọdụ nchekwa, ma kpọọ òkù ka a gbasokwa usoro ọhụrụ iji weta udo n'ebe ndị o metụtara.

 Dịka ọ na-agụpụta ozi Gọvanọ Fayemi, Jinadu kwuru na mbọ ndị lgbo na-agba doro Gọvanọ anya nke ọma, kwuo na ha na-eme nke ọma ma kpọkukwaa ha ka ha jide ka ha ji maka ọdịmma nke steeti Ekiti. 

Na mbụ mgbe ọ na-ekpe ekpere ọjị, onye ahụ nọchitere anya Gọvanọ kwuru sị: "Ọjị bụ maka ndụ. Onye wetere ọjị wetere ndụ. Ojị bụ maka udo, ka udo dịrị anyị niile. Ọjị bụ maka ọganihu, ka anyị niile nweta ọganihu n'ezinaụlọ anyị, obodo, na steeti Ekiti gbaa gburugburu."
 Ihe pụrụ iche e mere na mmemme ahụ gụnyere iti mmọnwụ, ịgba egwu ọdịnala dị icheiche, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ mere ka ya bụ mmemme zaa aha a kpọrọ ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484