EFCC Anwụchiela Mmadụ 29 Maka ‘Yahoo Yahoo’

May 9, 2022 - 23:21
 0
EFCC Anwụchiela Mmadụ 29 Maka ‘Yahoo Yahoo’


Izunna Okafor dere akụkọ a

Igbo sị na ọ na-abụ onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ.

Ka ọ dị taa, ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide igwù ojoro na ịmazụ ego ọhaneze n'ala Nigeria, bụ ụlọọrụ 'Economic and Financial Crimes Commission (EFCC)' anwụchiela mmadụ iri abụọ na abụọ a na-enyo enyo na ha bụ ndị na-egwu ojoro site n'usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ ịntanetị, bụ ndị a maara dịka ndị 'Yahoo Yahoo'.

Dịka ozi a kụpụrụ na nsonso a site n'aka ngalaba na-ahụ maka mgbasaozi n'ụlọọrụ EFCC, siri kọwaa, mmadụ iri abụọ na iteghete ahụ bụchà ụmụnwoke, ma bụrụ ndị a nwụchiri na mpaghara ‘247 Suite, Bishop Court, Aladinma Extension‘ dị n'Owerri, bụ isi obodo steeti Imo, na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria.

Ụlọọrụ ahụ nyèkwàrà aha ndị ahụ dịka: Iwueke Kingsley Clinton Ikechukwu, Nwafor Ikechukwu Okoha, Edokpayi Clifford Osamudiamen, Collins Arinze Chuwkwudiama, Chimezie Chukwuma Victor, Odo Chinedu Daniel, Humphery Chibueze Daniel, Henry Chibueze Bright, Akumadu Calvin Ifeanyi, Obilor Paul Ozioma, Chikezie Ekene Noble, Chigaemezu Dike Stanley, Kelvin Chibuzo Okafor, na Oparaji Prince Uchechi.

Ndị ọzọ gụnyere: Ejimonyeokwu Jessy Chinonso, Bosco Ndubuisi Chimuanya, Amaechi Michael Ikechukwu, Amma Wisdom Uzor, Duru Chibuike Augustine, Solomon Clinton Chidozie, Duru Francis Chiemela, Ugo Victor L
Kosisochukwu, Ibe Justice Chijindu, Iwuji Blaise Chimereucheya, Onyedibe Chukwuebuka Godwin, Dim Kizito Nnaemeka, Pastor Ikechukwu Goodness na Collins Arinze Chukwudiama.

Ihe dị icheiche e nwetere n'aka ndị ahụ gụnyere igwe ọtụtụ kọmputa laptọọpụ, ọtụtụ ekwentị, na ụgbọala abụọ.

Ozi ahụ a kpụrụ na-akọwakwa na nnyocha e megoro na-egosi na ndị ahụ bụ ndị na-etinye aka n'ụdị igwu ojoro ịntanetị dị icheiche, bụkwa nke ha sitere na ya wee na-anapụ̀sị ọtụtụ ọtụtụ ụmụ mmadụ ego, okachasị ndị ọcha na ndị ọzọ bi na mba ofesi.

Ya bụ ozi kọ̀wàkwàrà na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ebe a ga-eji usoro iwu wee lee ha ọrụ, ma ọ bụrụ na e mechaa nnyocha miri emi banyere ihe ahụ e mere.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484