Onye Ọrụ Obi Ebere Amalitela Ịrụ Okporoụzọ Ọhụrụ Abụọ n'Amawbia

May 6, 2022 - 18:38
 0
Onye Ọrụ Obi Ebere Amalitela Ịrụ Okporoụzọ Ọhụrụ Abụọ n'Amawbia

Izunna Okafor dere akụkọ a


Otu onye ọrụ obi ebere na-emetụ na-amasị, ma bụrụkawa nwaafọ obodo Ụmụawụlụ, bụ Maazị Christopher Ndubuisi nọrọ na nsonso a wee malite ọrụ idozi okporoụzọ abụọ n'Amawbia dị n'okpuruọchịchị Awka South nke steeti Anambra.

Okporoụzọ abụọ ahụ gụnyere nke siri ụlọ ezumeezu Ebe-Akpu wee gaa ụlọ mkpọrọ dị n'Amawbia, ya na nke siri ụlọ ezumeezu ahụ wee gaa n'ụlọ onyeisioche otu ndọrọndọrọ ‘All Progressives Grand Alliance (APGA)’ n'ala Nigeria, bụ Maazị Victor Oye.
 
N'okwu ya na mmemme ịgbape ọrụ okporoụzọ ahụ, Maazị Ndubuisi kọwara na nke ahụ bụ imezupụta nkwà o kwere n'ọnwa gara aga na be Maazị Victor Oye, oge ọ gara ịgwa ya banyere mmasị nwaanne ya nwoke, bụ Maazị Augustine Ekweozor nwere ịzọ ọkwa onye nnọchianya ọgbọ nta nkwàdo ‘Awka North and South Federal Constituency’ n'ụlọ omeiwu etiti na nhọpụta ahụ a ga-eme n'ahọ na-abịa abịa. O kwuru na ọ bụ ụbọchị ahụ ọ gara be Maazị Oye ka ọ chọpụtara na ụzọ ebe ahụ adịchaghị mma, o wee kwe nkwà na ọ ga-arụ ya.

Dịka ọ na-ekwupụta obiañụrị ya banyere mmasị ahụ Maazị Ekweozor nwere ịga nọchite anya mpaghara ahụ n'ụlọ omeiwu iji zọpụta ma kwuchite ọnụ ha nke ọma; ọ kpọkuzịrị ndị na-atụ akwụkwọ na mpaghara ahụ ka ha kwàdo ya nke ọma.

N'okwu nke ya, nwa amadi ahụ chọrọ ịzọ ọkwa ụlọ nnọchianya mpaghara ahụ, bụ Maazị Ekweozo kwuru na ọ bụ mkpebi ya na ebumnobi ya ije welatara ndị ahụ òkè ha nà èrèrè ọchịchị onye kwuo uche ya dịka o siri kwesi.

O kwuru na ọ bụ onye e ji ọrụ obiebre na ọrụ mmepe na ịkwàdò ụmụ mmadụ wee mara, ma kọwaa na ọ chọrọ ịga nọchite anya ha n'ihi na ndị nke nọ ebe ahụ kemgbe anaghị emecha nke ọma dịka a tụrụ anya. O kwukwara na ọrụ okporoụzọ ahụ a malitere ka bụgodi mbido n'ụdị mnnukwu mmepe dị icheiche ha ga-ahụ ma ọ bụrụ na ọ banye n'ọkwa ahụ.
 
Na ntụnye nke ya, onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Awka South nke abụọ n'ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Chukwuma Okoye kwupụtara obiụtọ ya na ihe ọma amalitela ime na mpaghara ahụ, ọkachasị n'obodo ya bụ Amawbia, ma kelekwazie onye ahụ na-arụ ya bụ ọrụ, bụ Maazị Ndubuisi maka ezi nzọpụụkwụ ahụ. Ọ kpọkukwara ndị ọzọ bụ ndị ji ego na ndị nọ n'ọkwa dị icheiche dị elu ka ha ñòmie ezi ọrụ ahụ ma jiri akụnụba ha na ọkwa ha wee kwàlite mmepe n'obodo ha dị icheiche, n'ihi na ọ bụghị iwu na a ga-echerịrị gọọmenti n'ihe niile.

Onye ọzọ kwuru okwu na mmemm ahụ ma bụrụkwa onyeisioche nchereoge  n'okpuruọchịchị ime obodo Awka South, bụ Maazị Leo Nwuba kèlere nwa amadi ahụ na-arụ okporoụzọ ahụ, ma mee ka a mara na a na-ezube inye ya onyinye nkwanyeugwu pụrụ iche n'aha okpuruọchịchị Awka South n'ihi ọtụtụ ọrụ ọma dị icheiche ọ rụgoro na mpaghara ahụ. Ọ rịọkwazịrị ya ka o jisie ike n'ọrụ ma ghara ịdà mba maọbụ kwee ka ihe ọbụla jụọ ya obi oyi n'ọrụ ọma ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484