Soludo Ekwela Nkwa Iwulite Ọdịmma Ndị Ọrụ Oyibo

May 6, 2022 - 12:44
 0
Soludo Ekwela Nkwa Iwulite Ọdịmma Ndị Ọrụ Oyibo

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo ekwupụtala mmasị na njikere ọchịchị ya ịkwàlite ọdịmma na ezi ọnọdụ obibindụ ndị ọrụ n'ime steeti ahụ.

Ọkammụta Soludo kwupụtara nke a n'okwu ya na mmemme imerube ụbọchị ndị ọrụ na mba ụwa, nke ahọ 2022, bụkwa nke e mere na steeti ahụ n'amaegwuregwu Alex Ekwueme dị n'Awka, bụ isi obodo steeti Anambra.

Ya bụ mmemme bụ nke dọtara ọtụtụ ndị òtù dị icheiche na steeti ahụ, ma bụrụkwa nke dọtara ndị isi ọchịchị steeti ahụ, nke ọ bụ Gọvanọ Soludo duru ha wee bịa.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Gọvanọ Soludo dụrụ ndị òtù ahụ jikọtara ndị ọrụ oyibo, bụ ‘Nigeria Labour Congress (NLC)’ ọdụ ka ha si n'ime ngagharịịiwe na ịkpọ ganịganị pụta ma banyezie na nzọpụkwụ na atụmatụ  ga na-akwàlite ọnọdụ mmepe.

Ọ kọwataara ndị ọrụ oyibo steeti ahụ na akụnụba adịghị ọtụtụ nke etu ahụ iji mezupụta ihe niile bụ mkpà ha ma kwe nkwa na ọchịchị ya ga-ahọpụta ụfọdụ ihe ndị ọchịchị ya ga-emenwuru ha n'ime ihe dị icheiche dị ha mkpa.

Ọ nọkwazịrị ebe ahụ kwpụta ma kwe nkwa na ịkwalite ọdịmma na ezi ọnọdụ obibindụ ga-eso n'isi sekpụ ntị n'ọchịchị ya n'ime steeti ahụ.

Gọvanọ Soludo kọwara ndị ọrụ oyibo Anambra dịka ndị na-agbasi mbọ ike ma na-emekwa ntụnye dị ukwuu n'ịkwalite agamnihu nke steeti ahụ; ma kwuo na ọ bụ nke a mere oke ụbọchị ahụ jiri dị mkpà ma bụrụkwa ụbọchị pụrụ iche iji merùbe ha bụ ndị ọrụ.

Ọ kpọrọ oku ka onye ọbụla tinye aka n'ọrụ ma tụnyekwa olu ya nà ụtụ nke ya n'imerùbè mmadụ ọbụla ji ùgwù na nsọpụrụ wee na-arụsi ọrụ ike iji wulite ọnọdụ mmepe na ọganihu obodo; ọbụladị dịka o kwupụtara na ọchịchị ya kụwdosiri ike n'iwèta obodo tọrọ ụtọ ma dịkwa mma obibi.

A nọkwara na mmemme ahụ wee nwee ịgba nkịtị otu nkeji maka ọnwụ Maazị Joe Anatune, bụ nye Gọvanọ Soludi kpọlitere n'ọkwa ọhụrụ ịbụ onyeisi ụlọọrụ ‘State Signage and Advertisment Agency (ANSAA)’, ma bụrụkwa onye nwụrụ ụbọchị Satọdee ka ọ gachara abalị olenaole e jiri kpọlite ya n'ọkwa nà abalị olenaole o jiri merubechaa emume ọgbụgba ahọ iri isii na abụọ ya.

Ndị dị icheiche sonyere na mmemme ahụ gụnyèrè Dọkịta Osote Gọvanọ steeti Anambra, bụ Dọkịta Onyekachukwu Ibezim; Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Rt. Hon. Uchenna Okafor; onyeisiocha òtù jikọtara ndị ọrụ, bụ ‘Nigerian Labour Congress’ (ngalaba steeti Anambra), bụ ‘Comrade’ Chinwe Orizu; na onyeisioche òtù ‘Trade Union Congress (TUC)’ ngalaba steeti Anambra, bụ Comrade Chris Ogbonna na ndị òtù ha, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484