Gọvanọ Obiano Agbapeela Ebe Obibi Ụmụakwụkwọ Na GTC Enugwu-Agidi

Mar 8, 2022 - 20:25
 0
Gọvanọ Obiano Agbapeela Ebe Obibi Ụmụakwụkwọ Na GTC Enugwu-Agidi

Izunna Okafor dere akụkọ a


Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Agbapeela
Anambra State Governor,ọmarịcha ebe obibi ụmụakwụkwọ a rụrụ ọhụrụ n'ụlọakwụkọ ‘Government Technical College, Enugwu-Agidi’ dị n'okpuruọchịchị ime obodo Njikọka nke steeti ahụ.

Gọvanọ Obianọ gbapere ya bụ ogige ebe obibi oge ọ gara njem nleta ọrụ n'obodo ahụ, ma bụrụkwa nke ụfọdụ ndị selitere isi n'ọchịchị steeti ahụ soro ya wee gaa.

Ogige ebe obibi ahụ bụ nke nwere àkwà ndina ruru narị asaa na iri ise n'ọnụọgụgụ, ma bụrụkwa nke anọ Gọvanọ Obianọ gbapegoro n'ụlọakwụkwọ 'Government Technical College' iri na abụọ dịgasị n'ebe dị icheiche na steeti ahụ.

Ogige ahụ nwèkwàrà ọkụ si n'anyanwụ adọta ike, ebe a na-aga mposi, ebe a na-asa ahụ, ite mmiri ruru puku lita iri, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ e ji enyere ndụ aka.

N'okwu ya oge ọ na-agbape ogige ahụ, Gọvanọ Obianọ kọwapụtara ọtụtụ uru dị icheiche dị n'ụlọakwụkwọ ebe a na-amụ nkànụzụ, ọkachasị n'ihi etu o si akwàlite mmepe n'ogoogo mba ụwa ma na-emekwa ka ụmụakwụkwọ gụrụ na ya bụrụ ndị kwụụrụ onwe ha ma na-enyekwa ọrụ ma ha gụchaa akwụkwọ, karịa ịbụ ndị na-achọ ọrụ achọ.

N'okwu nke ya n'ebe ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka mmụta na steeti ahụ, bụ Ọkammụta Kate Omenugha kpọpụtasịrị ọtụtụ ihe dị icheiche Gọvanọ Obianọ megoro na ngalaba mmụta n'ime steeti ahụ, n'ihi mmasị pụrụ iche o nwere n'ebe ihe gbasaara mmụta na agụmakwụkwọ dị, ọbụladị dịka ọ kpọkukwazịrị obodo dị icheiche gọọmenti rụrụ ihe n'obodo ha ka ha na-elekọta ma na-echekwa ya nke ọma, maka mbibì.

Ọtụtụ ndị dị icheiche ọnụ na-eru n'okwu n'ime steeti ahụ sonyèkwàrà na ya bụ mmemme.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484