N'Anambra, Kọndọktọ Anwụọla Ka Ụra Buchaara Onye Ọkwọ Ụgbọala N'okporoụzọ

Jun 5, 2022 - 17:45
 0
N'Anambra, Kọndọktọ Anwụọla Ka Ụra Buchaara Onye Ọkwọ Ụgbọala N'okporoụzọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Otu onye a maghị aha ya na-ahụ maka ịnakọ ego n'ụgbọala, nọrọ ụbọchị Tuzdee wee zute ọnwụ mberede ya n'ajọ ihe mberede okporoụzọ dapụtara n'ụzọ awara-awara ahụ siri Ihiala gaa Owerri, dị na steeti Anambra.

Onye na-ahụ maka ịkọwara ọhaneze ihe ha kwesiri ịma n'ụlọọrụ  ‘Federal Road Safety Corps (FRSC)’ n'ime steeti Anambra, bụ RC Margaret B. Onabe, bụ ya mere ka ụwa mara nke a site n'ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ ụbọchị Tuzdee, bụkwa nke o sitere na ya wee kọwaa na ihe ahụ mere n'akụkụ isi ụlọọrụ okpuruọchịchị ime obodo Ihiala, n'ihe dịka elekere ise nke ụbọchị ahụ.

Dịka o si kwuo, mmadụ irri abụọ na abụọ (nke gụnyere ụmụnwoke iri na asaa nà ụmụnwaanyị ise) nọ n'ime ụgbọala ahụ oge ya bụ ihe mere. O kwukwazịrị na otu onye n'ime ha (bụ onye nke na-ahụ na-anakọ ego n'ụgbọala ahụ) nwụrụ n'ihe mberede ahụ, ebe mmadụ anọ ndị ọzọ nwetàrà mmerụahụ n'ogogo dị icheiche.

Ọ gara n'ihu kwuo na ihe kpatara ihe mberede ahụ bụ ike ọgwụgwụ, ma kọwaa na ya bụ ọdachi metụtakwara ụgbọala abụọ, nke gụnyere ụgbọala Zhongtong Lọziriọsụ Bọọsụ (nwéré ákàrà: NNE423XB) nà otu ụgbọala ọzọ ha enweghị ike inweta ihe gbasaara ya.

RC Onabe si na otu onye ọnọmgbeomere ma bụrụkwa otu n'ime ndị njem nọ n'ụgbọala ahụ, kwuru na ike gwụrụ onye ọkwọ ụgbọala ahụ, nke mezịrị ka ụra buchara ya, ụgbọala ya wee jiri ọsọ gbakwuru ma suo otu ụgbọala ọzọ nọ n'ihu. Ọ sịkwà na ụgbọala ahụ o suru akwụsịghịkwa oge ya bụ ihe mberede mere n'ihi na ọ gbawààrà ọsọ.

Onabe kwukwàzịrị na e bugara ndị merụrụ ahụ n'ụlọọgwụ ‘Our Lady of Lourdes’ dị n'Ihiala maka inye ha ọgwụgwọ, ma dọnyekwazie ozu onye nke ahụ nwụrụ anwụ n'ụlọ nchekwa ozu dịkwa n'ụlọọgwụ ahụ, site n'aka ndị ọrụ FRSC sitere mpaghara RS5.34, Ihiala. Ọ sịkwa na ndị ọrụ FRSC ahụ bupùsìkwàrà ihe dị icheiche dachisiri ụzọ n'ebe ahụ ihe mberede ahụ mere, iji hụ na e nweghị agbakata akwụrụ n'okporoụzọ ahụ.

N'okwu ya banyere ya bụ ajọ ọdachi, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra bụ Maazị Adeoye Irelewuyi dọrọ ndị na-anyà ụgbọala aka na ntị ka ha na-akpachapụ anya oge niile ha nọ n'okporoụzọ, zèére ịgba oke ọsọ, ma jirikwa nwayọ nà uchè na-anyà ụgbọala. 

Ọ dụkwàra ndị na-anya ụgbọala ọdụ ka ha na-ezu ike oge kwesiri ekwesi ma na-arahụ ụra etu kwesiri, tupu ha eburu ụgbọala pụta n'okporoụzọ, iji zèéré itinye ndụ ụmụ mmadụ na-eme njem n'ajọ ọdachi ịke ihe mberede okporoụzọ.

Dịka ọ na-ekpe ka ndị nke nwetara mmerụahụ n'ihe mberede okporoụzọ ahụ gbakere ngwangwa, CC Irelewuyi kasikwazịrị ezinụlọ onye nke ha nwụrụ anwụ obi, kpee ka Chineke nabata ma nye mkpụrụobi onye ahụ nwụrụ anwụ ezumike udo.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484