Soludo Adụọla Ndị Ụka Ka Kwalite Ịdịnotu, Dịka Dayọsiisi Awka Mere Sinọọdụ

May 14, 2022 - 14:19
 0
Soludo Adụọla Ndị Ụka Ka Kwalite Ịdịnotu, Dịka Dayọsiisi Awka Mere Sinọọdụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo akpọọla oku ka a kwalite ịdịnotu, ezi mmekọrịta na njikọaka n'etiti ndị òtù ụka dị ocheiche, iji nye aka n'ibuli steeti ahụa na ọchịchị ya n'ogoogo dị elu.

Gọvanọ Soludo kpọrọ oku a n'okwu ya na mmemme iji chịkọta nnukwu ọgbakọ sinọọdụ ụka Angịlịkan na dayọsiisi Awka.

Ya bụ nnukwu ọgbakọ sinọọdụ bụ àgbà nke atọ nke sinọọdụ nke iri na abụọ nke dayọsiisi ahụ, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n'ụlọụka St. Peter's Church, Abagana dị n'okpuruọchịchị ime obodo Njikoka, nke steeti Anambra.

N'okwu ya n'ụka ịtụ mmamma e jiri chịkọta ya bụ sinọọdụ, Gọvanọ Soludo kwupụtara mkpa ọ dị ijikọta ọnụ n'etiti ndị ụka, ma chetakwara ndị sonyere na ya bụ mmemme ihe mgbadoụkwụ nke ọchịchị ya na-elekwasị anya na ya, nke bụ otu steeti, otu ndị mmadụ, otu atụmatụ.

Ka ọ na-ekwusi ike na iwu ụlọụka na ụlọakwụkwọ so n'otu n'ime ụzọ e si akwalite ma na-agbasa oziọma n'oge gboo, Gọvanọ Soludo dụrụ ndị ụka niile dị na steeti ahụ nwere ụlọakwụkwọ na ụlọọgwụ ọdụ ka ha mee ka ọ dị ọnụ ala, ọkachasị maka ndị ogbenye, n'ihi na nke ahụ sokwa n'otu ụzọ ha pụrụ isi tụnye ụtụ n'ịkwalite mmepe obodo, ezi mmekọrịta mmadụ na ibe ya na ọdịmma ọhaneze.

Ọ gbakwụnyere na, dịka ụzọ isi kwalite mmụọ ịdịnotu na steeti ahụ, na ọchịchị ya amalitela ikpe ekpere kwa ụbọchị n'ebe obibi Gọvanọ dị n'Amawbịa, bụ nke ndị otu okpukperechi dị icheiche so achịkọba ma na-esonyekwa na ya.

O mekwazịrị ka a mara na ọchịchị ya na ndị ọrụ ya dị ezi njikere iweta ezi ọchịchị tọrọ atọ na steeti ahụ, ma rịọkwazie ndị ụka ka ha na-echete ọchịchị steeti ahụ n'ekpere oge niile.

Na mbụ, onyeisi na sinọọdụ ahụ, bụ Bishọp ụka Angịlịkan na dayọsiisi Awka, ma bụrụkwa Ashbishọọpụ mpaghara Niger, bụ Ashbishọọpụ Alexander Ibezim kelere Chineke maka etu nhọpụta ọkwa gọvanọ e mere na steeti ahụ siri gaa nke ọma, bụ nke e sitere na ya họpụta la guzobe Gọvanọ Soludo na osote ya, dịka o siri bụrụ mmasị Chineke. 

Ọ nọkwazịrị na ya bụ mmemme kpeere Ọkammụta Soludo na osote ya, bụ Dọkịta Onyekachi Ibezim ekpere pụrụ iche, rara ọchịchị ha nyefee n'aka Chineke, ma kpee ka ọ bụrụ nke ga-aga siriri-werere, n'enweghị ihe mkpọbiụkwụ ọbụla.

Ọgbakọ sinọọdụ ahụ bụ nke isiokwu ya “Ịgba Ọsọ Eligwe: Mpụtara Dịịrị Onye Kwere Ekwe n'Ime Oge Jọgburu Onwe Ya”, nke pụtara na bekee “Running the Christian Race: Implications for Believers in Perilous Times.”

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484