Ọchịchị M Ga-Aga n'ihu Ịkwàlìtè Ọdịmma Ụmụaka — Soludo

Jun 5, 2022 - 17:39
 0
Ọchịchị M Ga-Aga n'ihu Ịkwàlìtè Ọdịmma Ụmụaka — Soludo


Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo ekwuputela ezi nkwadobe ọchịchị ya dị ịga n'ihu na-akwàlite ọdịmma nà ezi ọnọdụ obibindụ na agụmakwụkwọ ụmụafọ steeti ahụ.

Gọvanọ Soludo kwupụtàrà nke a na mmemme Ụbọchị Ụmụaka (Children's Day) nke ahọ 2022 e mere na steeti ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n'amaegwuregwu ‘Ekwueme Square’ dị n'Awka, bụ isi obodo steeti Anambra.

Dịka ọ gụpụtachra ozi onyeisiala Nigeria bụ Muhammadu Buhari zigààrà ụmụaka Nigeria maka oke ụbọchị ahụ, ya bụ Gọvanọ jupụtakwàzịrị na ọchịchị ya na-agbasi mbọ ike ịhụ na-aga akwụkwọ ụbọchị Mọnde ọbụla, bụ nke ndị ojiegbe na ndị omekoome megoro ka ọ gharazie ịdị etu ọ dị na mbụ, n'ihi iwu ‘Onye apụtakwala iro' ahụ ha tiri maka ụbọchị Mọnde ọbụla, nke e nweghị ezi uche maọbụ amamihe ọbụla dị na ya.

O kọwara na ọ bụ òkè na ọrụ dịịrị gọọmenti ịhụ na e nwere ezi nchekwa ndụ, ọbụladị ma ndụ ụmụaka; ma kwezie nkwà na gọọmenti ya ga-aga n'ihu n'ezi mbọ ahụ ọ na-agba ịhụ na e nweghị ihe ọbụla ga-adọghàchi aka elekere azụ n'ebe ndụ na ọganihu ụmụaka steeti ahụ dị.

N'okwu nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka ụmụaka na ọdịmma ọhaneze na steeti Anambra, bụ Oriakụ Ify Obinabo nyèrè nkọwa banyere mpụtàrà oke ụbọchị ahụ, ma kpọpụtasịkwa uru dị icheiche ụbọchị ahụ bara, ọkachasị na ndụ ụmụaka, n'ihi ụdị mmemme dị icheiche a na-eme na ya.

Ọ kpọkuru ndị nne na nna ka ha tute ezi mmekọrịta n'etiti ha na ụmụaka ha, ọkachasị site n'ilekọta ha anya nke ọma nà iwepụtara ha oge iji leba anya n'ihe na-akpa, ọnọdụ ha nọ na ya, nàkwà ihe dị icheiche ha na-eme. Ọ kpọkwazịrị òkù ka e nwekwuo ezi atụmatụ iwu na atụmatụ dị icheiche sitere n'aka gọọment ga-enye aka ịkwàlìtè ọdịmma ụmụaka.

Na ntụnye nke ya, Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ ‘Rt. Hon.’ Uchenna Okafor mere ka a mara na isiokwu mmemme ahụ nke ahọ a, nke bụ “Nkwàlitè Usoro Nkwàdo Maka Nchekwa Ụmụaka Nigeria: Òkù Maka Nteta n'Ụra” dabara adaba n'ezi atụmatụ ọchịchị ahụ Gọvanọ Soludo jiri bata n'ọkwa ọchịchị. O kwukwara na ụlọ omeiwu steeti ahụ ga-aga n'ihu n'ịtụnye ụtụ nke ya n'ịkwàlìtè ọdịmma na ikike dịịrị ụmụaka, ọkachasị site n'iwepụtasị atụmatụ iwu ga-enye aka n'ime nke ahụ; ọbụladị dịka o mere ka a mara na ọ bụ ụlọ omeiwu steeti ahụ bụ ụlọ omeiwu mbụ n'ala Nigeria kwadoro ma wepụta atụmatụ iwu maka ihe metụtara ụmụaka ụmụnwaanyị, bụ ‘Girl Child Bill’.

Mmemme ahụ bụkwà nke dọtara Ọkaikpe steeti Anambra, bụ Justice Onochie Anyachebelu nàkwà ọtụtụ ndị ọzọ dị icheiche e ji okwu ha agba izu n'ọchịchị steeti ahụ; ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya waa achịcha bekee, mee ịkwụ n'ahịrị na ifeaka, ma nyekwa onyinye nkwanyeugwu nyegara ụfọdụ ndị dị icheiche o ruru.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484