Ọba Akwụkwọ Anambra Emerùbela Emume Ụbọchị Akwụkwọ na Mba Ụwa

May 13, 2022 - 07:24
 0
Ọba Akwụkwọ Anambra Emerùbela Emume Ụbọchị Akwụkwọ na Mba Ụwa

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọba akwụkwọ steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee sonyeere ibe ya na mba ụwa na mmemme imerube emume ncheta ụbọchị akwụkwọ na ikike dịịrị onye na-ede akwụkwọ, bụ ‘World Book and Copyright Day’ nke ahọ 2022.

Ya bụ mmemme wééré ọnọdụ n'ogige ọba akwụkwọ Ọkammụta ‘Kenneth Dike State Central E-Library’ dị n'Awka bụ isi obodo steetu Anambra, bụ nke isiokwu ya bụ “Gụọ, Ka I Wee Ghara Ịnọ Naanị Gị” ma bụrụkwe mmemme dọtara ma ụmụ akwụkwọ praịmarị na sekọndịrị dị icheiche dị na steeti Anambra, tinyere ndị dị icheiche selitere isi na ngalaba mmụta na ụfọdụ ndị selitere isi n'ọrụ gọọmenti.

A nọkwara na ya bụ mmemme nye nkụzi, nwee mkparịtaụka, ma mekwa ihe ngosi ndị ọzọ dị icheiche.

N’ozi nnọọ ya na mmemme ahụ, onyeisi Ọbá Akwụkwọ Steeti Anambra steeti, bụ Dọkịnta Nkechi Udeze kọwàrà na ụbọchị ahụ bụ nke òtù mba mwa ‘United Nations Educational, Sayensị na Ọdịbendị (UNESCO)’ wepụtara maka imerùbè akwụkwọ na ndị na-ede akwụkwọ, ya na ịkọwa mkpa akwụkwọ dị na uru dị icheiche ịgụ akwụkwọ bara n'ụwa gbaa gburugburu. O kwukwara na mkpa akwụkwọ na ịgụ akwụkwọ dị bụ nke enweghị njedobe, ọbụladị dịka ọ gbara ụmụ akwụkwọ ume ka ha na-agụsi akwụkwọ ike, n'ihi na ọ bụ naanị site na ya ka mmadụ pụrụ isi mee nke ọma n'agụmakwụkwọ ya.

Ka ọ na-echetara ụmụ akwụkwọ ahụ na ndị ọzọ sonyere na mmemme ahụ na ọba akwụkwọ steeti Anambra na ngalaba ya dị icheiche abanyela n'usoro dijitaalụ ma nwekwa ọtụtụ akwụkwọ dị mma; Dọkịnta Udeze dụkwàzịrị ha ọdụ ka ha na-aga n’ọ́bá akwụkwọ mgbe niile maka na ibriri/ịgbaziri  akwụkwọ.

N'okwu nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka mmụta na steeti ahụ, bụ Ọkammụta Ngozi Chuma-Udeh toro ọba akwụkwọ Anambra maka ezi ọrụ ọ na-arụ n'ịkwalite omenala ịgụ akwụkwọ, ọbụna dịka tòkwàrà ndị ọkà edemede na agụmagụ na steeti ahụ na n'ụwa niile gbaa gburugburu, tinyekwara ndị ọzọ na-eme ka edemede, agụmagụ na mmụta na-agawanye n'ihu n'oge ugbua.

Kọmishọna ahụ, nke ọ bụ onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na mịnịstrị ahụ, bụ Maazị Nnaemeka Egwuonwu nọchitere anya ya, kpọputasịrị ụfọdụ ihe iche aka mgba dị icheiche ndị na-ede akwụkwọ na ndị na-ebipụta akwụkwọ na-agabiga n'ogr ugbua; ma mee ka a mara na ụlọọrụ ya na-agbasi mbọ ike iji kwalite ọnọdụ mmụta na omenala ịgụ akwụkwọ n'ụlọ akwụkwọ dị icheiche na steeti ahụ.

Na ntụnye nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na steeti ahụ, bụ Sir Paul Nwosu, nke Maazị Emmanuel Ikeagwuani nọchitere anya ya dụrụ ụmụakwụkwọ sonyere na mmemme ahụ ọdụ ka ha jiri ịgụ akwụkwọ na ide akwụkwọ mere enyi, ma dụọkwa ha ọdụ ka ha tinye ihe niile dị icheiche ha mụtara na mmemme ahụ n'ọrụ na .

Na mbụ n’okwu mmalite ya, onyeisioche nke mmemme ahụ, Chiifu Dike Ndulue kwuru na ọ dị mma icheta mbọ ndị ukwu ndị ode akwụkwọ na-agba na nnukwu ntụnye dị icheiche ha na-eme n'ịkwalite agụmagụ na mmụta, ọbụladị dịka ọ gwara ụmụakwụkwọ ahụ ka ha na-agụsi akwụkwọ ha ike.

Na nkụzi ya, onye ọbịa nyere nkụzi na mmemme ahụ ma bụrụkwa onyeisi ngalaba na-ahụ maka Asụsụ Bekee na Agụmagụ na mahadum UNIZIK, bụ Ọkammụta Jane Ifechelobi kọwàrà ige ntị, ide ihe, ịgụ akwụkwọ, na ịghọta ihe dịka ihe anọ dị óké mkpà maka mmadụ iji mee nke ọma n'agụmakwụkwọ ya.

N'okwu ha dị iche iche, ụfọdụ ndị mere mkparịtaụka na mmemme ahụ, nke gụnyere Dọkịnta Paul Ifeanyi, Dọkịnta Ngozi Osuchukwu na Dọkịta Chinelo Ezechukwu, bụ ndị tụlere isiokwu "Ọdịda Omenala Ịgụ Akwụkwọ n'Ebe Ụmụakwụkwọ Nọ" gụpụtàrà mkpọpụ uche nke sitere na soshal midia na ikiri onyoonyoo mgbe niile dịka ụfọdụ ihe na-ebute ọdịda omenala ịgụ akwụkwọ n'ebe ụmụakwụkwọ nọ, bụkwa nke na-akawanye njọ kwa ụbọchị.

Ka ha na-agwa ndị nne na nna ka ha malite n'oge kụnyebe omenala ịgụ akwụkwọ n'ime ụmụ ha ma na-ahazi oge ha ga na-eji ekiri onyoonyoo n'ụlọ; ha kwupụtakwara mkpa ọ dị na uru ọ bara ịzụtara nwatakịrị akwụkwọ dịka ihe onyinye; ọbụladị dịka ha rịọkwara gọọmentị ka o tinyekwuo ego n'ịkwàlite ọbá akwụkwọ dịgasị n'ụlọakwụkwọ, dịka otu n'ime ụzọ kwàlite omenala ịgụ akwụkwọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484