Ọgwụ Ego: Ndị Iwe Juru Obi Agbaala Mmadụ Abụọ Ọkụ n'Ogun

Feb 16, 2022 - 21:13
 0
Ọgwụ Ego: Ndị Iwe Juru Obi Agbaala Mmadụ Abụọ Ọkụ n'Ogun

Izunna Okafor dere akụkọ a

Igbo sị na ọ bụrụ na a gbaghị ụzọ oweri mgba ọ naghị echi.

N'ihi nke a, ndị ntorobịa iwe juru obi nọrọ na nsonso a wee mụọ mmadụ abụọ a na-enyo enyo na ha bụ onye ọgwụ ego ọkụ na steeti Ogun. Ya bụ nnukwu ihe nkiri bụ nke mere n'obodo Oja-Odan dị n'okpuru ọchịchị ime obodo ‘Yewa-North’ nke steeti ahụ.

Dịka akụkọ siri kọọ, mmadụ abụọ ahụ a mụrụ ọkụ, bụ Idowu Afolabi na Johnson Adebiyi bụ ndị ụmụokorobịa jidere na mpaghara ahụ ka ha jigasị ákụ̀kụ̀ ahụ mmadụ e gburu ọhụrụ, wee kpụrụ ha nyefèé ha n'aka ndị uweojii, a kpọchie ha.

Kaosiladị, égwú dàghàrịzịrị oge ọtụtụ ndị ntorobịa jìrì iwe wee wụchaa n'ogige ndị uweojii ahụ, wakpò ndị uweojii nọ n'ọrụ ebe ahụ, ma bàá n'ime ebe ahụ a kpọchiri ndị ahụ, dọpụta ha, tie ha gwoogwoo, ma gbaa ha ọkụ ozigbo n'ihu ogigè ndị uweojii ahụ, ma gbaa ha ọkụ ozigbo, ha wee ghọọ ntụ.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ katọrọ akparamagwa ahụ ụmụnwoke ahụ kpara, kọwaa ya dịka nke kọgburu onwe ya, ma mekwa ka a mara na ya agaghị anabàtazịkwa ụdị ihe dị etu ahụ ọzọ na mpaghara ebe ọbụla na steeti ahụ. 

Dịka ozi a kụpụrụ site n'aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n'ime steeti ahụ, bụ Maazị Abimbola Oyeyemi siri kọwaa, ọ bụ oge ndị uweojii na-agba ndị ahụ e jidere ajụjụọnụ kà ndị ntorobịa ahụ wakpòrò ha, wee dọpụta ha iro, tigide ha ihe, tigbuo ha, ma mụọ ozu ha ọkụ.

Ọ kọwara na onye a na-enyo ènyò ka bụ onye a na-enyo ènyò, wee ruo mgbe ụlọikpe kpechaara ikpe wee ma onye ahụ ikpe; ọbụladị dịka ọ dọkwara ndị mmadụ aka na ntị banyere igbu onye a na-enyo ènyò egbu, n'ihi na onye ọbụla mere ihe dị etu ahụ ọzọ ga-eji anya ya wee hụ ntị ya n'ejighị ènyò.

Ọ gakwàzịrị n'ihu wee mee ka a mara na onyeisi ndị uweojii enyela ntụziaka ka e mee nnyocha miri èmì banyere okwu ahụ, iji chọpụta ma nwụchikọọ ndị so wee rụọ arụrụala ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484