Gọvanọ Soludo Ezigarala Ndị Omeiwu Anambra Aha Ndị A Ga-Eme Kọmishọna

Apr 1, 2022 - 22:04
 0
Gọvanọ Soludo Ezigarala Ndị Omeiwu Anambra Aha Ndị A Ga-Eme Kọmishọna


Izunna Okafor dere akụkọ a


Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo ezigarala ndị ụlọ omeiwu steeti ahụ aha mmadụ iri abụọ, ndị a ga-eme Kọmishọna na ngalaba ụlọọrụ dị icheiche na steeti ahụ.

Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti ahụ, bụ Maazị Uchenna Okafor bụ ya kwupụtara nke a n'ọgbakọ ndị omeiwu ahụ nwere ụbọchị Tuzdee n'isi ụlọọrụ ha dị n'Awka.

Aha ndị ahụ, dịka Ọkammụta Soludo siri zite ha gụnyere Maazị Ifeatu Onejem (onye a ga-eme Kọmishọna na-ahụ maka ego), Ọkammụta Offonze Amucheazi (onye a ga-eme Kọmishọna na-ahụ maka ala), Injinia Ifeanyi Okoma (onye a ga-eme Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ), Chiamaka Helen Nnake (onye a ga-eme Kọmishọna na-ahụ maka amụmà ego ọrụ na atụmatụ ọnọdụ akụnụba), Dọkịta Afam Obidike (onye a ga-eme Kọmishọna na-ahụ maka ahụike), Maazị Patrick Mba (onye a ga-eme Kọmishọna na-ahụ maka nkwàlite ndị ntorobịa).

N'ịga n'ihu, Oriakụ Ifeyinwa Obinabo (onye a ga-eme Kọmishọna na-ahụ maka ihe metụtara ụmụnwaanyị na ụmụaka), Dọkịta Obinna Ngonadị (onye a ga-eme Kọmishọna na-ahụ maka azụmahịa na ụlọ mmepụta ngwaahịa), Injinia Julius Chukwuemeka (onye a ga-eme Kọmishọna na-ahụ maka Ọkụ na mmiri), Ọkammụta Ngozi Chuma-Udeh (onye a ga-eme Kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ), na Maazị Paul Nwosu (onye a ga-eme Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi) sòkwá n'aha Gọvanọ Soludo zigara.

Ndị ọzọ gụnyèrè Dọkịta Foster Ihejiofor (onye a ga-eme Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ ugbo), Ọkaiwu Patricia Igwebuike (onye a ga-eme Kọmishọna na-ahụ maka njem), Maazị Felix Odumegwu (onye a ga-eme Kọmishọna na-ahụ maka gburugburu), Maazị Chikodi Anara (onye a ga-eme Kọmishọna na-ahụ maka ihe na-eme be anyị), Ọkammụta Sylvia Ifejeme (onye a ga-eme Kọmishọna na-ahụ maka ikpe nkwụmọtọ na steeti ahụ), Maazị Collins Nwavunwanne (onye a ga-eme Kọmishọna na-ahụ maka ọchịchị ime obodo na echichi ọdịnala), Maazị Donatus Onyenji (onye a ga-eme Kọmishọna na-ahụ maka omenala na ime ndị mmadụ obiañụrị), Ọkaiwu Anthony Ifeanya (onye a ga-eme Kọmishọna na-ahụ maka ihe a na-egwupụta n'ime ala), na Ọkaiwu Palinus Onyeka (onye a ga-eme Kọmishọna na-ahụ maka ewemewu ụlọ).

N'okwu ya banyere aha ndị ahụ e ziteere ha, Ọkaokwu Uchenna Okafor kọwara na ndị ahụ bụ ndị ga-esonye n'isi ọchịchị steeti ahụ ngwangwa ndị ụlọ omeiwu ahụ nabatara ma kwàdó mkpọlite ahụ a kpọlitere ha, dịka ọ dị na mpaghara 192 nke iwu na-achị ala Nigeria, nke ahọ 1999 dịka a siri megharịa ya.

Ọ hafèkwàzịrị ọrụ ahụ n'aka ndị òtù ọrụ ga-ahụ maka inyòcha ha wee zighachitere ụlọomeiwu ahụ ozi ihe a ga-eme banyere mkpọlite ahụ a kpọlitere ha.

Ndị omeiwu ahụ nọkwàzịrị n'ọgbakọ ahụ wee kwàdo ma nabata mkpọlite Gọvanọ Soludo kpọlitere mmadụ iri na ise dịka ndị ndụmọdụ pụrụ iche nye ya na ngalaba dị icheiche, dịka ọ dị na mpaghara 196 nke iwu na-achị ala Nigeria, nke ahọ 1999 dịka a siri megharịa ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484