Ndị Ọrụ Nchekwa Akụtuola Ụlọ Ebe Nzuzo Ndị Omekome n'Anambra

Jun 16, 2022 - 17:13
 0
Ndị Ọrụ Nchekwa Akụtuola Ụlọ Ebe Nzuzo Ndị Omekome n'Anambra


Izunna Okafor dere akụkọ a

Gọọmenti steeti Anambra ewelitekwuola aka n'agha ahụ ọ na-ebu megide ndị omekome nà ndị ọzọ na-eme mpụ dị icheiche na steeti, dịka ọ wakporo, kụtuo ma bibie otu n'ime ebe nzuzo ndị ntọ na steeti ahụ.

Mwakpo ahụ na ịkwatu ebe nzuzo ahụ bụ nke ndị ọrụ nchekwa dị icheiche jikọtara aka ọnụ wee mee n'Oba, dị n'okpuruọchịchị ime obodo Idemmili South nke steeti ahụ, bụ ebe ha kwaturu otu ụlọ ala ebe ndị omempụ ahụ jiri mere ebe nzuzo na ebe ha na-edebesi ụfọdụ ndị mmadụ ha tọ̀tàrà.

Tupu a kwatuo ụlọ ahụ, ndị ọrụ nchekwa ahụ bu ụzọ wakpo ụlọ ahụ, bụkwa ebe ha jidere ụfọdụ ndị omekome ahụ na ndị ọzọ a na-enyo enyo na ha na ha na-arụkọ. Ihe dị icheiche e nwetekwara n'ebe ahụ gụnyere ụdị mma dị icheiche, egbe, okwu arụsị, anwụrụ̀ ike, ụdị ekwentị dị icheiche, ọkụ, ego, ọgwụ a gwọrọ agwọ, mgbọ egbe a gbabeghị agba, m̀kpà, na ụfọdụ ihe ndị ọzọ.

Ndị omempụ ahụ ka e kwuru na ọ bụ ha kpara ọtụtụ mkpamkpa a kpagasịrị n'akụkụ ebe dị icheiche na steeti ahụ Anambra na nsonso a, nke gụnyere ọrụ ịtọ̀rọ̀ mmadụ ha gara n'Oko, nke dị n'okpuruọchịchị ime obodo Orumba North, na Ekwulobia, dị n'okpuruọchịchị ime Aguata, ebe a tọọrọ, opekatampe, mmadụ anọ ụbọchị ahụ, tupu ndị uweojii wee wakpo ha, gbagbuo otu onye n'ime ha, ma merezie nnyocha chọba ndị nke fọrọ afọ, wee mechaa chọpụta ebe nzuzo ha dị n'Oba, wee ga wakpòkwa ebe ahụ na nsonso a.

Ọ dị ncheta na aka na-achị steeti Anambra bụ Ọkammụta Chukwuma Charles Soludo, n'oge mgbasaozi izugbe o mere n'ụbọchị Wenezde, abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Mee ahọ a, kwùrù hoohaa na a ga-akụtù ụlọ ebe obibi ọbụla maọbụ ụlọ oriri na ọṅụṅụ ọbụla a hụrụ ka ndị omekome na-ezo na ya maọbụ na-eme mpụ na ya.

Ka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu  n'ebe obibi ya dị n’Amawbia, mgbe a kụtùchara ụlọ ahụ, aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo tòrò mbọ ndị ọrụ nchekwa steeti ahụ na-agba, ma kwuo na etu ahụ e siri kwatu ma bibie ụlọ ahụ ga-abụ ihe ịdọ aka ná ntị nye ndị omekome ndị ọzọ; ka ha mara na ha enweghị ọnọdụ maọbụ ebe obibi ọbụla na steeti ahụ.

Ọ kọwara na ha chọpụtàrà na ụlọ ahụ a kwaturu bụ ebe ndị omekome ahụ na-anọ eme mpụ dị icheiche; ma kwukwa na ọchịchị ya agaghị enye ohere ọbụla maka mpụ na arụrụala ndị ọzọ na steeti ahụ.

Gọvanọ Soludo dọkwara aka ná ntị na site ugbua gaba n’ihu, nà ndị omekome agaghị enwekwa ọnọdụ n’akụkụ ebe ọbụla n'ime steeti ahụ ọzọ, n'ihi na a ga-aga n'ihu ibuso ha agha. O kwupụtàkwara ọchịchị ya dị njikere ma na-agbasi mbọ ike iweghachite ezi ọnọdụ udo na nchekwa tọrọ àtọ̀ na steeti ahụ, iji hụ na ndị mmadụ ga-enwekwa ike ịgagharịrị onwe ha n'atụghị egwu ọbụla.

O tòkwàrà nkwàdó nke ụfọdụ ndị steeti ahụ na-enye ndị ọrụ nchekwa, ọkachasị ndị na-enye ndị ọrụ nchekwa ozi dị mkpa na ozi bara uru na-enyere ha aka n'ọrụ ha, ma dụ̀kwa onye ọbụla ọdụ ka o ǹòmie nke ahụ.

Gọvanọ Soludo kwukwaziri ọzọ na gọọmenti ga-aga n'ihu ịkwatu ụlọ ọbụla a na-eji eme mpụ na mpaghara ebe ọbụla na steeti ahụ, ma sụchakwa ọhịa ọbụla a hụrụ ndị omekome jiri mere ebe obibi. Ọ kpọkukwara ndị mmadụ ka ha na-akpachapụ anya n'ihe gbasaara nchekwa mgbe niile, ma na-enyekwa ndị ọrụ nchekwa ozi banyere onye ọbụla a na-enyo enyo na gburugburu ha.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ DSP Tochukwu Ikenga kwupụ̀tàkwara na ọ bụ eziokwu na a kwaturu ụlọ ahụ, ma kọwaa ka ya bụ ọrụ gara nke ọma.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484