Donald Trump na Kim Jong-un agazịghị enwe nzukọ na Sịngapọ

Donald Trump na Kim Jong-un agazịghị enwe nzukọ na Sịngapọ

May 24, 2018 - 18:25
Jan 19, 2021 - 18:26
 0
Donald Trump na Kim Jong-un agazịghị enwe nzukọ na Sịngapọ

Onye isi ala mba Amerịka na-ewegharazị onwe ya na nzukọ ahụ Ọ dịburu na mbụ kwete n’etiti ya na onye isi ala mba Nọt Korịa. Taa bụ Tọzdee, abalị 24, nke ọnwa Mee, Trump Trump degara Kim Jong-un akwụkwọ sị na ya achọzịghị isonye na nzukọ ahụ n’ihi akparama agwa yana ụdịrị ajọ okwu si Kim Jong-un n’ọnụ apụta kemgbe abalị ole n’ole.

Trump na Kim Jong-un dịburu na mbụ nwee nkwekọrịta ịnwe nzukọ ịkpa ụbụbọ gbasara otu ndị Nọt Korịa ga-esi kwụsị atụmatụ ịrụpụta ngwa ọgụ nuklịa nke nwere ike ịferu mba Amerịka. Ha kwekọrịtara ịnwe nzukọ ahụ na Sịngapọ n’abalị 12 nke ọnwa Juunu.

Nzukọ ahụ kwesịburu ịbụ nke izizi onye isi mba Amerịka na onye isi Nọt Korịa ga-ezute ihu na ihu.

N’izu ụka gara aga, mba Nọt Korịa na Saụt Korịa kwesịburu ịnwe nzukọ nke ha. Mana Kim Jong-un mechara kagbu ya n’ihi na, ka a ka na-akwado nzukọ ndị a, ndị agha mba Amerịka na ndị agha mba Saụt Korịa gara n’ihu n’ime ngosipute ike nke ha na-adịbu eme kwa mgbe kwa mgbe.

Kemgbe ahụ ka ndị mmadụ na-atụ anya na nzukọ Trump na Kim Jong-un ahụ agaghị enwe isi.

Kim Jong-un kwuru ho ha na ya agaghị akwụsị atụmatụ nuklịa ya kpam kpam, mana ndị Amerịka aghọtaghị ebe Nọt Korịa gbadoro ụkwụ. Trump cheburu na ọ bụrụ na ya na Kim Jong-un zute ihu na ihu, nke ahụ ga-eme ka Nọt Korịa kwụsị atụmatụ nuklịa ahụ ha ji na-aka.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.