Ekele n'Ala Igbo: Oge Mbụ na Oge Ugbua

Nov 27, 2021 - 22:47
 0
Ekele n'Ala Igbo: Oge Mbụ na Oge Ugbua


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị Igbo sị na ọ na-abụ e kwe ekele, ihu asaa, ma sịkwa na ekele e kweghị ekwe dapụụrụ mmụọ onye kelere ya. 
Onye chọrọ ịma ga-ajụzị, sị 'Ọ bụ gịnị bụ ekele?'

Ekele bụ bụ ime óbì e gosipụtàrà n'elu ọnụ, ma bụrụkwa echiche óbì e mepụtàrà n'omume. Nke a pụtara na ekele bụ ụzọ mmadụ si ekwupụta maọbụ egosipụta ka obi dị ya nyegara mmadụ ibe ya, mmụọ maọbụ Chi kere ya. Ọ bụ ime obi e gosipụtara n'elu ọnụ, ma bụrụkwa echiche e mepụtara n'omume.

Ekele pụtara ọtụtụ ihe n'ebe ọtụtụ ndị nọ n'ihi na ọ bụ ezie na uche bụ uche, mana nghọta dị iche iche. Ndị ọbụla nwèrè ụzọ dị iche
iche ha si ekele ekele maka na nkụ dị na mba na-eghere mba nri. Ọ
bụkwa ihe ndị na-aghọta ka ha na-asụ. Ekele ndị ọbụla na-agbakwasịkwa ụkwụ n'asụsụ ha n'ihi na ekele niile nwere ụsà. Onye aghọtaghịkwa ihe e kelere ya apụghị ikwe ekele ahụ, maka na mmadụ abụghị oke ngwere
na-ekwe n'isi nye ihe ọbụla ọ nụrụ; ma nke a gwara ya ma nke a gwaghị ya, maọbụ ma nke ọ ghọtara ma nke ọ ghọtaghị.
Nke a pụtara na ndị Igbo, ndị Hausa, ndị Yoruba, ndị ọcha na ndị àgbụrụ dị iche iche na mba ụwa nwere ekele nke ha, n'asụsụ ha dị iche iche.

N'ala Igbo, e nwere ụdị ekele dị iche iche, nwee oge e ji ekele ha, ma nwekwa ihe nke ọbụla na-egosipụta. Iji maa atụ, e nwere
ekele ọrụ bụ nke a na-ekele ndị na-arụ ọrụ (dịka: daalụ, ndeewo, jisie
ike, i meela, ike agwụla gị), ma bụrụkwa nke na-egosipụta otuto na agbamume nye ndị na-arụ ọrụ.

E nwere ekele onye ihe mere bụ nke e ji akasí mmadụ obi banyere
ihe dakwasịrị ya, dịka ndo, dibe, kara obi/kàá obì. E nwekwara ekele oge ụbọchị, bụ ndị a na-ekele n'oge dị iche iche n'ụbọchị, dịka ụtụtụ ọma, ehihie ọma, mgbede ọma, uhuruchi ọma, ka chi fo. Ndị Igbo nwekwara ekele a na-ekele onye na-eme njem, dịka: ije ọma, ladị mma/ laa mma o, jee lọta, ka ọ dị, ije awele, ka e mesịa. A na-ekelekwa onye lọtara alọta 'nnọọ'.

E wezuga ekele ndị a, ndị Igbo nwegasịzịkwara ụfọdụ ekele ndị ọzọ dị iche iche ha na-ekele na mgbe na mgbe, ọkachasị n'oge gboo. Mana ihe ndị kacha apụta ihe n'ekele ndị a niile bụ nghọta, nsọpụrụ, na obi e ji ekele ha.
 
Na mgbe ochie ahụ, bụ oge elu bụ ala ọsa na oge mmadụ ji uche
eme ihe; ụmụaka nwere nsọpụrụ ma nwekwa egwu, ndị okenye na-ejikọlo ma
na-akwanyere onwe ha ugwu iji wee dị mma ikele ekele,  ndị mmadụ
ghọtakwara ihe ekele pụtara. Nke a mezịrị na ekele na-atọ ụtọ n'ọnụ
oge ahụ ma na-edozikwa ahụ. Ige ndị a bụcha ihe a na-ahụta n'oge gboo.
        Mana oge ugbu a, ihe ndị a aghasasịala. Ụmụaka amaghịzịkwa
onye bụ okenye ma ya fọdụzie inwe nsọpụrụ. Ndị okenye n'onwe ha
adịghịzịkwa ejikọlo onwe ha, ma ya fọdụzie ime ka okenye. Onye ọbụla
na-erezị ugwu ya, na-egoro ihere. Ndị okenye na-alụtazị ekele n'ọgụ,
ebe ụmụaka na-akwazị ekele dịka iyi. Ekele wee na-akọzị ọkọ n'ahụ onye
na-ekwe ya, ma na-adụzịkwa ogwu n'ọnụ onyd na-ekele ya. Ọ bụzị onye
were ọnụ rịọta ekele, o were gịnị kwe ya?
       N'oge mbụ, nwa agbọghọ hụ okenye (ọkachasị nwoke) ka ọ na-aga
n'ụzọ, ọ ga ehu ala kelee ya tupuu ọ gafee. Ọ bụkwa site n'ụzọ dị otu
a ka ụfọdụ si ahọta nwa agbọghọ nwere nsọpụrụ ha ma ọ bụ ụmụ ha lụrụ,
maka na omume onye na-edu ya.
Mana ugbu a, nwata nwa agbọghọ ahụ okenye n'ụzọ, kama ọ ga-ekele ya
ekele ya ekele nkịtị ma ya fọdụzie nke ihukpu ala; o letọba onye ahụ
anya na mkpụrụ anya ma ọ bụ sèé ihu ka nwa enwe imo Ọka gafere, dịka a
ga-asị na ọ chọrọ ịgba ya enyi, ma ọ bụ na ya na ndị ka ya jide ego
emekọọla ihe.
         Ihe ndị a wee bụrụ nnọọ nzuzu dị oke ọnụ ahịa n'ebe ọtụtụ ndị
mmadụ nọ, ọ kachasị ụmụ agbọghọ na ụmụ okorobịa. Ụfọdụ hụkwuzie mmadụ,
ha atụfuo ihu, ma ọbụ malite ịza oku ekwentị ndị mmụọ. Ekele n'ala
Igbo n'elu ugbu a bụzịkwa nchi taa arụ, o wee taa, maka onye
echetereghị, ọ gaghị ekele.
        N'aka nke ọzọ, ikele ụfọdụ ndị okenye ekele ugbu a bụzị iticha
aka n'akpụkpụ ehi na ịgbasa mmiri n'elu okwute n'ihi na obi ọjọọ na
ọnụma na-ekojuzịkwa obi ụfọdụ oge niile. E kelee ha ekelee, ha araa
ntị mmanụ ka ngwere aghọ, ọ bụrụ na e keleghị ha, ha achọba onye
ga-ebo ibu ọnụma. Ụfọdụ anaghịzịkwa ekweputa ekele ekweputa; E kelee
ha ụtụtụ, ehihe, abali, naanị ihe a ga na-anụ bụ 'mmn'. Ngọzị
anaghịzịkwa eso ekele dịka n'oge gboo maka na onye nkele ejighị obi ya
ekele, onye na-ekwe ekwe ejighịkwa obi ya ekwe.
        Ihe niile na-adazịkwa nghata nghata; nkọcha wee na-esozị ekele
karị ngọzị dịka ọ dị n'oge gboo. Ugbu a bụ oge a ga-ekelechaa onye
na-eme njem ''ije ọma'',  ọ pụọ n'ụzọ o nwee ihe mberede okporo ụzọ,
nwụọrọ onwe ya, ma ọ bụ oge a ga-ekelechaa mmadụ "ka chi fo" ma ọ bụ
"rahụọ nke ọma"; onye ahụ lakpuo ụra, o kwogide ọnwụ, nwụọrọ onwe ya.
Nke ahụ wee bụrụ n'ihi na ekele esighịzị n'obi apụta.
         Ekele bụ ụtọ nwanne. Eke bụ isi udo. Ekele bụ onye nye ọ
nara. Ekele bụ nsọpụrụ. Ekele bụ nghọta. Ekele bụkwazị omenala.
Ya mere ndị Igbo, ka anyị werenụ ekele kpọrọ ihe ma chukwaa ya dịka
otu n'ime omenala na ejirimara anyị pụrụ iche.
        Ọ dịkwa mma ka m mee ka a mara na ekele, oge ụfọdụ abụghị site
n'onye tọrọ ma ọ bụ onye bụ okenye; ọ bụ ihe mmadụ na-echere mmadụ ibe
ya. Ya bụ na ikele ekele bụ ọrụ dịịrị onye ọbụla n'ala Igbo -- ma
okenye ma ụmụaka. A sị na a na-egosi nwata awọ n'ipko okwute, a
na-ebibe ya aka. A sịkwa na ọ bụ  nne ewu na-ata agba, nwa ya
ana-elere ya anya.
       Ngwa ngwa anyị malitere ịghọta uru ekele bara na iji ya kpọrọ
ihe, ngwa ngwa ka anyị malitere itinye aka n'ịkwalite omenala, ezi
njirimara na ọdịnala ndị Igbo.
       Onye a gwara kwe, a hụ ọzọ, agwakwa ya. Omenala Igbo ga-adị.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484