LASEMA Ebidola Ịkụkpọ Ụlọ Na-Achọ Ịdà Àdà Na Surulere

Nov 3, 2021 - 21:33
 0
LASEMA Ebidola Ịkụkpọ Ụlọ Na-Achọ Ịdà Àdà Na Surulere

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ụlọọrụ 'Lagos State Emergency Management Agency (LASEMA)' nọrọ na nsonso a wee malite ịkụkpọ ụlọ ebe obibi nwere nsogbo ma na-achọkwa ịdà àdà na mpaghara Aguda dị na Surulere nke steeti Lagos.

Dịka ozi a kụpụrụ site n'aka ụlọọrụ ahụ siri kọwaa, ha zigara 'Cobra Squad' ha dị n'Onipanu, gaa na 'No. 4 Kola John Street off Fehintola Giwa Street, Aguda Surulere' ebe e nwere ụlọ otu akụkụ ya dara ada n'abalị ụbọchị ụka, nke mezịrị ka ọ bụrụ ihe izendụ na ihe égwù nyegara ndị bi ebe ahụ.

Kaosiladị, ozi ahụ mere ka a mara na o nweghị onye ọbụla nwụrụ n'ihe mberede ahụ oge ahụ otu akụkụ ụlọ ahụ dara oge. Ndị ụlọọrụ ahụ, site na njikọaka LASBCA, LNSC na ụlọọrụ 'Lagos State Task Force' gbaara wee gaa n'ebe ahụ ya bụ ihe mere, iji mara ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ.

Ya bụ ozi gakwazịrị n'ihu kọwaa na ụlọọrụ LASEMA agwala ndị bi n'ụlọ ahụ ka ha kwakọrọ ngwongwo ha pụọ n'ebe ahụ, iji zeere ọnwụ mberede maọbụ ihe ọdachi ọbụla ịdapụta.

Ọ bụzị oge ụlọọrụ a mechaara ihe ndị ka ha bagidezịrị n'ịkụkpọ ụlọ ahụ, ka o wee ghara ịdà, tigide mmadụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484