Ngaghari iwe na London

Dec 29, 2011 - 06:00
Jan 22, 2021 - 06:10
 0
Ngaghari iwe na London

Ndị Channels Television na-akọwa n’ụmụ afọ ala Nigeria bi na United Kingdom na-akwado ime ngagharị iwe na London. Ha chọrọ iji nke a gosi na ha kwụnyere ụmụ nne ha na ụmụ nna ha, ndị nọ na Nigeria na-eme ngagharị iwe. Ha chọrọ igosi na ha kwadoro oku ahụ a na-akpọ ka gọọmenti Nigeria weghachi ọnụ ahịa mmanụ ụgbọala ebe ọ nọ mbụ

Onye isi otu ụmụ akwụkwọ na mba ofesi (Student Association of Nigeria in Diaspora), Olalekan Oshunkoya, gwara ndị nta akụkọ na ndị uwe ojii na London enyego ha nnakwe ime ngagharị iwe n’ogige ebe ụmụ afọ Nigeria bi na London na-enwe nzụkọ, bụ ebe a kpọrọ Nigerian House na bekee.

Ngagharị iwe a ga-amalite na Nigerian House na London n’ụbọchị Fraịdee, abalị isii nke ọnwa a bụ Jenuwarị.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.